Onyeisiala Muhammadu Buhari akwadola imeghari n’ọkwa nke Maazị Aliyu Abubakar na Mazị John Asein dịka ndị Directors General otu Legal Aid Council of Nigeria (LACON) na Nigerian Copyright Commission, n’otu n’otu.
Nke a dị n’ozi nke Director Press and Public Relations Federal Ministry of Justice, Oriakụ Modupe Ogundoro wepụtara na Sunde n’Abuja.
Ogundoro kwuru na e megharịrị nhọpụta Abubakar maka oge nke abụọ na nke ikpeazụ ya ga abụ afọ anọ site n’akwụkwọ ozi Ref: PRES/97/HAGF/174 nke abalị iri na abụọ ọnwa Jenụwarị, 2023 dịka akụkụ nke 3 (1) na (2) nke Legal Aid Act, CAP. L9.
N’otu aka ahụ, e megharịkwara nhọpụta Asein maka oge nke abụọ na nke ikpeazụ nke afọ anọ site na akwụkwọ ozi Ref: PRES/97/HAGF/175 nke abalị iri na abụọ ọnwa Jenụwarị, 2023 gbadoro ụkwụ na ngalaba 36 (1) na (2) nke iwu Nigerian Copyright Commission, CAP C28.
Ozi ahụ kwuru na mmeghari nke nhọpụta mmadụ abụọ bụ n’ihi ọrụ ọma nke ụlọ ọrụ abụọ ndị a.
N’otu aka ahụ, onyeisiala kwadokwara nhọpụta Mazi Abiodun Aikomo ka ọ bụrụ odeakwụkwọ ngalaba na-ahụ maka ikpe ziri ezi (Administration of Criminal Justice Monitoring Committee,ACJMC) maka ọchịchị mbụ nke afọ anọ (4) n’usoro nke 471 (2) nke iwu Administration of Criminal Justice Act (ACJA) 2015 site n’akwụkwọ ozi Ref: PRES/97/HAGF/173.
Nhọpụta nke Abubakar na Asein malitere dịba ire site n’abalị iri na abụọ onwa Jenụwarị, ebe nhọpụta nke Aikomo malitere ịdị irè site n’abalị iri na isii Jenụwarị 2023.
Dị ka ozi ahụ si kwuo, ụgwọ ọnwa ha na ọnọdụ ọrụ ndị ọzọ bụ ihe amapụtarala n’okpuru iwu Certain Political Office Holders Salaries and Allowances Act 2008.
NAN
Leave a Reply