Take a fresh look at your lifestyle.

Kelechi Chinwendu ji eserese egosi omenala IGBO.

Chigo tụgharịrị ya na bekee.

0 272

 

Abum onye nchọcha omenala na omenkà lekwasịrị anya n’akụkọ ihe mere eme na ịma mma omenala Igbo. Ana m akuzi akuko omenaala na nka nka Uri/Uli, nke bu ihe eji achọ mma oge ochie nke umu nwanyi igbo mebere n’ebe ọwụwa anyanwụ Naijiria ugbua. M na-eji ọrụ m dị ka olu maka nka Igbo nakwa dị ka ihe na-aga n’ihu n’ichepụta omenala Igbo na ịchọ mma, nke dị mwute ikwu na ọ fọrọ nke nta ka ọ laa n’iyi. Obi dị m ụtọ na etinyere m aka na Equiano.Stories Project – ihe nkiri nwere ogologo ogologo na Instagram na Tiktok gbasara nna ochie Igbo bụ Olaudah Equiano- ebe m mere omenala Igbo na uri/uli na Ukara Ohuru. Obi dịkwa m ụtọ na m malitere ọrụ “Ikenga Ọhụrụ” bụ ihe na-aga n’ihu n’usoro ọmụmụ mmụọ nke ndị Igbo bụ ndị Ikenga. Ọrụ a rụrụ n’oge ihe ngosi ihe nkiri mepere emepe na African Artists’ Foundation na Lagos, Nigeria, na Jenụwarị 2022, n’oge obibi nka ebe ahụ n’oge ahụ. Ihe oru ngo a gosikwara n’ime mbipụta dịka akwụkwọ akụkọ Gida, na na fim. Ọ bụ ọrụ na-aga n’ihu nke obi dị m ụtọ nke ukwuu ma nwee okwukwe na ya. Nọrọ na nche maka mmelite na ya.

Leave A Reply

Your email address will not be published.