Take a fresh look at your lifestyle.

NNPC Ga-Egwu Olulu Mmanụ Izizi Na Steeti Nasarawa

Chuka Eze dere ya na Bekee

0 434

Ụlọ ọrụ Nigerian National Petroleum Company NNPC Limited adịla njikere igwu olulu mmanụ mbụ na Nasarawa steeti, mgbago ugwu Naijiria na ọnwa Maachị afọ 2023.

Onye isi otu ụlọ ọrụ ahụ, Mallam Mele Kyari, kwupụtara nke a mgbe Gọvanọ steeti ahụ bụ Maazị Abdullahi Sule duuru ndị nnọchi anya ụmụafọ steeti ahụ ama ama na njem nkwanye ugwu na NNPC Ltd dị n’Abuja wee kwuo na nsonaazụ mnyocha na-egosi na e nwere nnukwu akụrụngwa mmanụ n’ime ala na steeti ahụ.

Ọ kpọrọ oku ka e mee ngwa ngwa na ọrụ a n’ihi na enweela mbelata na ntinye ego na mmanụ ọkụ n’ụwa gbaa gburugburu.

“Aghaghị ịrụ ọrụ a ngwa ngwa n’ihi na ụwa dum na-apụ na mmanụ ọkụ n’ihi mgbanwe ike, ma ọ bụghị etu a, afọ iri site ugbu a, ọ dịghị onye ga-ekweta itinye ego na azụmahịa mmanụ belụsọ na ọ na-abịa site n’akpa ego gị” Mallam Kyari kwuru.

Ọ gbakwụnyere na nkwado obodo na gburugburu dị mma bụ isi ihe na-eme ka ọrụ na-aga nke ọma na mpaghara ahụ iji zere ahụmahụ nke e nwetara na Niger Delta.

Na nzaghachi ya, Gọvanọ Sule kelere GCEO maka ezi mmalite mmepụta mmanụ na ọrụ mmepe nke Kolmani Integrated nke Onyeisiala Muhammadu Buhari bidoro na Nọvemba afọ 2022.

“Achọrọ m ikele ụnụ, ndị isi ụlọ ọrụ NNPC na gọọmenti etiti maka ihe ụnụ mere na Kolmani, maka ndị na-amaghị ihe ụnụ meere Naijiria, aha ụnụ adịghịzị nchezọ.” Gọvanọ Sule kwuru.

Ọ jara Onyeisiala Muhammadu Buhari mma maka nkwado ya ma kwe NNPC nkwa gburugburu dị mma. Ndị sonyere Gọvanọ ahụ na njem nleta ahụ bụ osote Gọvanọ, Dọkịta Emmanuel Akabe, onye isi oche otu All Progressive Congress na onye isi ọchịchị mbụ nke steeti ahụ, Senator Abdullahi Adamu, onye bu ya ụzọ, Senator Tanko Almakura, Mịnịsta na-ahụ maka gburugburu ebe obibi, Mohammed Hassan Abdullahi, Emir of Lafia, HRH Justice Sidi Bage Muhammad, na ndị isi ndị ọzọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *