Dọkịnta Aggarwal kwuru na ọgwụ nwereike ime ka nwata na-arahụ ụra karaịa etu o kwesịrị. Lee nkọwa ndị ọzọ o nyere:
- “Mgbe nke a mere, ọ bụrụ na e nwere ihe tọrọ n’akpịrị ya, ihe ahụ agaghị enweike ịpụta n’ihi na nwata ahụ ga na-arahụ ụra.”
- “Ịṅụ ọgwụ ụkwara na-ebutekwara ụmụntakịrị ọbara mgbatu ala (low blood pressure).
- Ọgwụ ụkwara nwereike ibutere nwata nhịahụ n’iku ume dịka azụzụ nwereike ime
- Onwekwara ike iwetu ikuku ndụ (oxygen) dị n’ahụ nwata
N’ọdị nso a, na mba Gambia, ụmụaka karịrị 60 nwụrụ n’ihi ọgwụ ụkwara ha ṅụrụ nke e si mba India mepụta.
Ọ bụ eziokwu na gọọmentị mba India na-ekwu na ọgwụ nke ụmụaka ahụ ṅụrụ bụ nke adigboroja, ọ bụghị nke esi mba ha bubata na Gambia.
Mana otu ‘World Health Organisation’ adọọla aka na ntị ka ndị mmadụ zeere ọgwụ ndị ahụ.
Ihe ị ga-eme ma nwata na-akwa ụkwara?
Ọ dị mfe ịzụta ọgwụ ụkwara na ọgwụ azụzụ n’ụlọahịa ebe ọbụla a na-ere ọgwụ, mana ọ dịghị mma inye ya nwata ọbụla na-agafebeghị afọ abụọ.
Ụkwara maọbụ azụzụ abụghị ihe nwereike igbu nwatakịrị.
Ngwalaba na-ahụ maka nri na ọgwụ, a na-akpọ Food and Drug Administration Agency (FDA) na mba Amerịka kwuru na onweghị enyemaka ọbụla pụrụ iche ọgwụ na-enyere ha n’ọnọdụ ahụ. Ihe i nwereike ime bụ:
- Inye nwata ahụ mmiri ọkụ maka akpịrị ya
- Ịtụnye ya ụdị mmiri pụrụiche a na-akpọ ‘saline nose drops’ n’imi ka imi ya ghara ịkpọchi
- Weta akụrụngwa a na-akpọ ‘humidifier’ iji mee ka ikuku nwata na-ekuru ghara ịkpọ nkụ. ‘Humidifier’ kwesịrị ịbụ nke jụrụ oyi, ọ bụghị nke dị ọkụ
- Nwee akụrụngwa a na-akpọ ‘bulb syringe’ maka ụmụaka na-erubeghị otu afọ. Ọ bụ ihe eji ewepụ ihe na-apụta ụmụaka n’imi
Ndị dọkịnta na-adọ aka na ntị ka a ghara inye ụmụaka ihe dịka mmanụ aṅụ, ginger maọbụ lemon.