Take a fresh look at your lifestyle.

Etu osi aga bu bu ineba aha n’mpaghara owuwanyanwu Naijiria-INEC

0 353

Ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka na Naịjirịa bụ ‘The Independent National Electoral Commission (Inec)’ zipụtara ozi na ha ga-amalite inye ndị debanyere aha inweta akwụkwụ ikike ịtụ vootu nke a ana-akpọ Permanent voters card (PCV) taa bụ Mọnde, ụbọchị 12 nke ọnwa Disemba.

Inec kwụsịrị ndebanye aha n’abali iri ato na otu nke ọnwa Julaị, 2022 iji hazie ma bịpụta akwụkwọ ikike ndị a.

Lee etu nnata akwụkwọ ikike ndị a si aga n’akụkụ Ọwụwa Anywanụ Naịjirịa dị iche iche.

PVC Colection: Ụlọọrụ Inec n’Awka kpọchiri akpọchi taa

Na-agbanyeghị nnukwu mmiri zọro, ọtụtụ ndị mmadụ pụtara iwere Kaadị  PVC n’ụlọọrụ Inec dị n’isiụlọọrụ Okpuru Ọchịchị Obio/Akpor dị na Rịvas steeti. people still stood their ground for the love of a better Nigeria. They chose to be drenched rather than going home without their PVCs

N’ Abia, ịnata PVC anaghị egbu oge

Oge onye ntaakụkọ anyị gara n’ụlọọrụ Inec dị n’ Okporouzọ Adelabu Street, Adelabu street isiobodo Abia, hụrụ PVC, ma hụkwa ụmụamala na-eche ka o ruo ha ka ha were nke ha.

Otu onye bịara ị nara akwụkwọ PVC bụ Obioma Onyeaghala gwara onye ntaakụkọ anyị na o werughị ya nkeji iri ịnata ya.

O jikwa ohere ahụ kpoku ndị mmadụ ha ga were nke ha.

Gladys Chukwu bụ onye nwetakwara nke ya negbughị oge kwukwara na ọ dị mfe inweta ya ma gwa onye ntaakụkọ anyị na ya ejikerela maka ntuliaka na-abịa.

Anambra steeti: A kpọchiri ụlọọrụ Inec akpochi Igwe ndị mmadụ gbakọtara n’akụkụ Anambara dị iche iche dịka ha pụtara inweta akwụkwọ ikike ịtụ vootu ha.

Ndi ntaakuko gara n’ụlọọrụ Inec ndị dị n’Awka bụ isi obodo Anambra steeti. N’okpuruọchịchị Njikoka, Awka South, Oyi nakwa Dunukofia, enweghị ndị ọrụ Inec a hụrụ dịka ebe niile tọgbọọ chakoo ma a gbachiri ụlọọrụ ahụ niile agbachi. Ụfọdụ na-eche na e nwereike ịbụ na nke a mere maka iwu onye nọrọ n’ụlọ nke otu Indigenous People of Biafra (Ipob) tinyere bụrụ kwa ụbọchị Mọnde ma mechaa kagbuo ya.

Kemgbe afọ 2021 ya bụ iwu ka na-aga n’ihu n’akụkụ Ọwụwa Anyanwụ dị iche iche dịka ụfọdụ ndị otu ojiegbe amabeghị ndị ha bụ na-amanye ndị mmadụ ya bụ iwu.

Imo steeti: Ndị bu egbe kụsara ụlọọrụ Inec n’Owere

Ọsọ tara n’ụlọọrụ Inec n’Owere bụ isi obodo Imo steeti n’ụtụtụ taa dịka ndị bu egbe wakporo isi ụlọọrụ Inec dị ebe ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Michael Abattam kwuru na ndị uweojii gburu mmadụ atọ n’ime ndị bịara mwakpo a ebe otu onye uweojii tụnyere ndụ ya dịka ha kwarịtara mgbọ. Otu onye uweojii ọzọ merụkwara ahụ.

Abattam gara n’ihu kọwaa na ndị ekperima ahụ si n’ogige ebe a na-ere mmanụ ụgbọala iji tụbanye ogbunigwe ahụ n’ime ụlọọrụ ndị Inec.            O kwuru na ọ bụ ụlọ abụọ nakwa otu ụgbọala dị n’ogige ụlọọrụ Inec ka ọkụ ahụ metụtara.                                                                                             Ọ gara n’ihu kwuo na ha bụ ndị uweojii anaghị arahụ ụra gbasara ọnọdụ nchekwa n’Imo steeti iji hụ na ntuliaka 2023 ga-agarịrị n’ihu dịka e si hibe ya.                                                                                                           Cheta na ndị ojiegbe wakporo ndị ọrụ Inec ma gbuo otu onye ọrụ Inec n’okpuruọchịchị Ihitte Uboma n’Ọnwa Eprel, 2022 mgbe a na-eme ndebanye aha maka inweta ikike ịtụ vootu.                                                   E chere na ndị mere mwakpo a bụ ndị na-amanye ndị mmadụ iwu onye nọrọ n’ụlọ dịka ndị mmadụ ụjọ gbaa ọsọ ebe ahụ.

Ebonyi steeti: Ndịọrụ Inec apụtaghị

Isi ụlọọrụ Inec n’Abakalili, Ebonyi steeti tọgbọ chakoo dịka enweghị onye ọrụ Inec ọbụla a hụrụ ebe ahụ.

E nweghịkwanụ ndị a hụrụ bịara inweta akwụkwọ ịtụ vootu ha mana ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa wụjuru n’akụkụ ogige ụlọọrụ Inec niile ebe ahụ.

Cheta na ndị ojiegbe amabeghị ndị ha bụ wakporo akụkụ Ebonyi steeti dị iche iche n’ụtụtụ taa bụ Mọnde.

Akụkọ kwuru na ndị ojiegbe ahụ mụnyere akụkụ ahịa Ishieke ọkụ ma gbakwa otu ụgbọala ọkụ n’ahịa New Market dị nso okporoụzọ si Abakaliki gawa Enugu. Onye ntaakụkọ BBC Igbo ji anya ya hụ etu ebe niile siri tọgbọ chakoo dịka ndị mmadụ ji ụjọ gbabasia be ha.

Kọmịshọna mgbasaozi na steeti ahụ bụ Uchenna Orji kwuru na enweghi onye maọbụ akụnụba onye ọbụla ya bụ mwakpo metụtara dịka ọ gbarụrụ ihu nye iwu nọrọ n’ụlọ ahụ. O gwara ndị mmadụ ka ha gawa mkpa ha ma ghara ịnọ n’ụlọ taa bụ Mọnde

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *