Take a fresh look at your lifestyle.

Etu m ga-esi kwụsị nsogbu na ndọrọndọrọ ndị Ipob – Atiku Abubakar

0 380

Atiku Abubakar, bụbu osote onyeisiala Naịjirịa, ekwuola etu ọ ga-esi kwụsị ndị mmadụ na mpaghara Naịjirịa dị icheiche na-achọ nnwereonwe, nke gụnyere ndị otu ‘Indigenous People of Biafra’ (Ipob).

O kwuru nke a na mkparịtaụka pụrụ iche nke ụlọntaakụkọ Channels TV hibere maka ndị na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka 2023.

Atiku kwuru na ya kwenyere na ihe ndị bi na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa chọrọ bụ inwe ohere iji ihe dị na be ha na-ewulite mpaghara ha n’ụzo o kwere ha.

“O doro m anya na ihe ndị IPOB na-achọ bụ Biafra, mana ọ bụ ihe kwere omume inweta Biafra taa? Kedụ ụzọ a ga-esi nweta ya? Ọ bụ site na mkparịtaụka ka ọ bụ site n’ịlụ agha ọzọ? Anyị a ga-emenwu ịlụ agha ọzọ?” Atiku jụrụ.

“Ekwenyere m na anyị ga-enwe ike ịkpọ ndị a na-azọ nnwereonwe na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ oku maka mkparịtaụka. Anyị kwenyere na ihe ha chọrọ abụghị ịpụ na Naịjirịa kpamkpam kama ọ bụ inwetụ ohere ime ihe n’onwe ha.

“Ọ bụ ya mere anyị ji ekwu na anyị ga-ahazigharị usoro ọchịchị Naịjirịa, site n’inyekwu mpaghara dị icheiche ike nakwa nlekọta akụ ọnatarachi ha.

“Iji maa atụ, e nwere mpaghara ‘Eastern Nigeria’ n’ọchịchị Rịpọblik nke mbụ. Ha jikwa aka ha were ihe ọnatarachi ha nwere na-ewetara onwe ha mmepe etu ike si kwe ha.

“Etu m si hụta ya, ndọrọndọrọ nnwereonwe niile a bụ maka na ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ na-ahụta na a na-agụpụ ha agụpụ n’usoro e si enye ike ọchịchị na Naịjirịa, ebe anyị na-ekwu na anyị nọ n’ọchịchị inye kwuo uche ya.

“Onweghị mpaghara ọbụla na Naịjirịa ga-emeri ike ọchịchị ma ọ bụrụ na ha agafeghi akwa mmiri Niger, maọbụ kwee ka ha na mpaghara ndị ọzọ jikọọ aka.

“Otu a ka anyị kwesịrị isi na-eche echiche: Olee ụzọ anyị na mpaghara ndị ọzọ ga-esi jikọọ aka iji nweta ike ọchịchị anyị na-achọ maọbụ iji chọta ihe ndị anyị na-achọ?

“Otu a ka m che ndọrọndọrọ kwesịrị isi dị, ọ kachasị dịka o si metụta Ipob.”

N’okwu nke ya, Gọvanọ Delta Steeti bụ Ifeanyi Okowa, onye na-azọ ọchịchị dịka osote Atiku, kwuru na e lee anya etu ihe dị ugbua, a ga-ahụ n’ezie na ọ dị ka a na-akpachapụ ndị si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n’akụkụ.

I lee anya na nhazi ndị isi ọrụ nchekwa Naịjirịa ugbua, ị gaghị ahụ ọtụtụ ndị Ọwụwa Anyanwụ ebe ahụ. Ya mere ha ji ahụta onwe ha dịka ndị a gụpụrụ agụpụ na Naịjirịa,” Okowa kwuru.

“Mana nke a abụghị ụdị gọọmentị Atiku ga-ahazi ma ọ bụrụ na o merie ọchịchị. Ọ ga-agụnye onye ọbụla nakwa mpaghara ọbụla na Naịjirịa iji mee ka onye ọbụla na-ahụta onwe ya dịka otu mba.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *