Take a fresh look at your lifestyle.

Kọmịshọn Ọnụ Ọgụgụ Na-azụ Ndị Ọrụ Maka Ọnụ Ọgụgụ Afọ 2023

Bitrus Kozah dere ya na Bekee

0 375

Ụlọ ọrụ na-ahụ maka ọnụ ọgụgụ n’Naijiria ebidola ọzụzụ izugbe maka ndị ọrụ ya maka nkwadebe ọnụ ọgụgụ mmadụ na ụlọ nke afọ 2023.

Ọzụzụ a ga-adaba n’ebumnobi ikike nke kọmịshọn ahụ iji chọpụta ọzụzụ kwesịrị ekwesị a chọrọ.

Onye isi oche kọmishọn ahụ bụ Maazị Nasir Kwarra kwuru nke a n’oge ọzụzụ ndị ọrụ n’Abuja, isi obodo Naijiria.

“Ọ dị mkpa na a ga-eji ndị ọrụ nwere ọgụgụ isi ọgbaraọhụụ” yana ihe omume ọzụzụ agwakọtara maka ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ na ụlọ afọ 2023″

Ọ gara n’ihu kọwa na “Ọzụzụ e mebere n’ịntanetị ebidola, ebe ọzụzụ maka ndị nkuzi na-esochi ya”

Ebumnobi nke “Ọzụzụ ndị nkuzi” gụnyere; Ịkwadebe ndị nkuzi ọkwa dị elu maka ọzụzụ ngụkọ ahaziri ahazi, kuziere nke ọma echiche na nkọwapụta maka ọnụọgụgụ wee nye ụkpụrụ doro anya maka usoro ngụkọ ogige maka ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ na ụlọ afọ 2023″.

O kwupụtara na “Ọdịmma ndị ọrụ maka ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ na ebe obibi nke afọ 2023 nwere nnukwu mmetụta na nsonaazụ nke ngụkọ ahụ.”

 

Ike Umenaba

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *