Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọ Ọrụ NHIA Na NBA Ga-Ejikọta Aka Maka Nkọwa Iwu Ahụike

Gloria Essien

0 439

Ụlọ ọrụ nchịkọta ahụike nke a kpọrọ National Health Insurance Authority (NHIA) na otu ndị ọka iwu, Nigeria Bar Association (NBA) ga-ejikọta aka maka nkọwa iwu ahụike n’Naịjirịa. Onye isi ụlọ ọrụ nchịkọta ahụike ahụ bụ Ọkammụta Muhammed Sambo kwupụtara nke a oge onyeisi NBA bụ Maazị Yakubu Maikyau gara leta ya n’ụlọọrụ ya n’Abuja.

Ọkammụta Sambo kwuru na ihe ndị NHIA rụpụtara bụ n’ihi nkwụsi ike nke ụlọ ọrụ ahụ ya na ndọnye ukwu nke ndị ụlọ ọrụ dị iche iche.

Onye isi ahụ rụtụrụ aka na NHIA ga-akpọkọba nzukọ ndị nchịkọta ahụike nke a ga-eji nwee njikọta ọnụ karịa. NBA ga-eso na nzukọ ahụ. O kwukwara na dị ka ndị iwu ahụike doro anya, NBA ga-eso na kọmitii niile.

“Nke a bụ ekele maka nnukwu ọrụ NBA rụrụ na ụlọ ọrụ ahụ. Anyị ga na-arụkọ ọrụ ọnụ ruo mgbe anyị ga-enweta nchịkọta ahụike zuru ụwa ọnụ”. Ọkammụta Sambo kwukwara.

Na mbụ, Onye isi oche NBA bụ Maazị Yakubu Maikyau, kwuru na mba nwere ahụike bụ mba nwere akụ na ụba. O kwuru na ọrụ dịịrị NBA bụ ịhụ na NHIA gara n’ihu. Anyị nwere ndị ọkaiwu dị otu narị puku na iri atọ na ise n’Naịjirịa. Anyị nwekwara atụmatụ itinye ha n’iwu nchịkọta ahụike”. Maikyau kwuru.

O kwekwara nkwa inye ndị ọkaiwu maka ọzụzụ ndị ọrụ NHIA na iwu metụtara ahụike.

Ike Umenaba

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *