Naijiria nwụchiri ndị ọrụ NIMC adịgboroja.
Ndị agha Naịjirịa bụ Operation HADIN KAI na ndị uwe ojii Naịjirịa na ndị ọrụ mbata na ọpụpụ Naịjirịa ejidela mmadụ abụọ a na-enyo enyo na ha bụ ndi adigboroja National Identity Management Commission, ndị ọrụ NIMC na Niger Republic.
Onye isi ọrụ nchekwa mgbasa ozi, Major General Musa Danmadami kwupụtara nke a n’oge mkparịta ụka Bi-weekly na Abuja, isi obodo Nigeria na-ekwu na nchịkọta akụkọ ahụ kpuchiri oge site na 6th ruo 20th October 2022.
General Danmadami kwuru na “ndị a na-enyo enyo gara Gagamari, ndị gbara ọsọ ndụ, ogige IDP na Niger Republic iji debanye aha ndị na-abụghị Naijiria n’ogige IDP.”
O kwuru na ihe ndị e nwetara n’aka ndị a na-enyo enyo gụnyere National Identification Number, igwe ndebanye aha NIN, igwe na-ebi akwụkwọ, igwe laminating, igwe na-ahụ maka kọmputa na igwe ọkụ ọkụ na ihe ndị ọzọ.
Leave a Reply