Take a fresh look at your lifestyle.
independence

bbc

Ncheta odachi ENDSARS Ihe ndị mere taa afọ abụọ gara aga

0 253

 

Taa ka o mere afọ abụọ Ndịagha Naijiria ji wụọ ndị na-eme ngaghariiwe Endsars mgbọ ma gbuo ụfọdụ n’ime ha na Lekki Toll Gate dị na Legọs afọ 2020.

Ndị kpebiri na ha ga-eme ngagharị were mee ncheta ndị ogbo ha e gburu.

Ụlọọrụ ‘Amnesty International kwuru na e gburu mmadụ 56 na nghariiwe ahụ bụ nke ndị ntorobịa mere megide ịnwụchị ezighị ezi, mmmekpa ahụ nakwa ogbugbu n’aka ndị uweojii.

Ndị ntorobia Naijiria mere ngagharịiwe ịzụụka abụọ na-eti mkpu maka mmekpa ahụ nke ha sị ngalaba ndịuweojii pụrụ iche e hiwere maka ibu agha megide iji egbe ozu ohi nke a kpọọ SARS..

Gọọmenti Etiti kwere ha nkwa ikposa to ahụ ma hiwe otu iwu ga-enyocha ebubo ndị eboro ndị ọrụ SARS.

Mana nke a akwụsịghị ngaghariiwe ahụ dịka ndị ntorobịa gbara isi akwara sị na ọ bụghị ụbọchị ahụ ka Gọọmenti kwewere nkwa eme eme.

Ha malitere tiwe mkpu maka ajọ ọchịchị.

Leave A Reply

Your email address will not be published.