Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe mere m ji rịọ ụmụ Naịjirịa mgbaghara maka ọchịchị di m – Aisha Buhari

0 345

Aisha Buhari bụ nwunye Onyeisiala Naịjirịa, Muhammadu Buhari akọwaala ihe mere o jiri rịọ ụmụafọ Naịjirịa mgbaghara maka ọchịchị di ya.

Na mkparịtaụka pụrụiche ya na ndi ntaakụkọ, Aisha sị na n’uche nke ya, na di ya agbalịala n’ọchịchị ya kama na ọ maghị ihe o mere ọ bụ ihe ndị Naịjirịa chọrọ.

Na ọ bụ n’ihi nke a mere o jiri rịọ ndị Naịjirịa mgbaghara, maka na o nwere ike ha emeghi ihe ndị mmadụ na-atụ anya n’aka ha.

O kwuru na ndị Naịjirịa tụrụ anya n’aka ọchịchị ha dị ukwuu

Mgbe a jụrụ ya ebe ndị o cheere ọchịchị di ya emeghi nke ọma, Aisha kwuru na ọ maghị.

N’okwu ya “Ụlọọrụ nke m dịka ebe a n-enyere ndị mmadụ aka, ana m anabatakaarị ndị mmadụ ebe a ma kwadoo ha n’ihe banyere ahụike na agụmaakwụkwọ”.

Aisha gara n’ihu kwuo na o nwere olileanya na otu APC nọ n’ọchịchị ugbua ga-alaghachite n’ọkwa ma e mechaa ntuliaka n’ọnwa Febuwarị afọ 2023.

Onye bụ Aisha Buhari?

  • Aisha Buhari (a mụrụ ya Aisha Halilu) bụ nwunye onyeisiala Muhammadu Buhari.
  • Dị ka o si kwuo, a mụrụ ya ma zụọ ya na Yola dị n’Adamawa steeti.
  • A mụrụ ya n’afọ 1971 ma mechaa gaa Mahadum dị na Maiduguri.
  • Ọ lụrụ di ya bụ onyeisiala n’ọnwa Disemba afọ 1989.
  • Ọ nwetara ọzụzụ dịka onye nkuzi ma gụo ‘Social Studies’ ka ọ dịrị ya mfe ịzụ ụmụ ya.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *