Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe mere o ji dị mkpa inye ụmụaka ọgwụ mgbochi maka ọrịa a

0 652

Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na ha etinyela ọgwụ mgbochi a kpọrọ ‘Rotavirus Vaccine’ ka ọ bụrụ iwu na ụmụaka niile a mụrụ ọhụrụ na Naịjirịa ga-agbarịrị ya.

Mịnịstrị ahụike kwuru nke a n’Abuja n’ụbọchị Mọnde ma kọwaa na ya bụ ọgwụ mgbochi ga-abụ n’efu n’ihi na gọọmentị nakwa otu na-akwalite ọgwụ mgbochi n’ụwa niile bụ GAVI akwụọla ụgwọ ya.

Ọnụọgụgụ gosiri na ụmụaka ọnụọgụgụ ha ruru puku iri ise na-anwụ kwa afọ n’ala Naịjirịa n’ihi nje ‘rotavirus’

Gịnị bụ ọrịa ‘Rotavirus’?

Rotavirus bụ ọrịa nje na-efe efe nke na-akpata afọ ọsịsa na mmadụ ịnyụ nsị mmiri mmiri nke bekee na-akpọ ‘diarrhea’.

Nje a na-emetụta ma ụmụaka ma okenye, mana ọ na-aka njọ n’ahụ ụmụaka na-erubeghị afọ ise.

Ọrịa ‘rotavirus’ na-amalite ma ọ gachaa ihe dịka abalị abụọ mmadụ butere ya bụ nje.

Etu nje a si efesa bụ site na mmadụ imetụ onye butere ya bụ nje ahụ, maọbụ ịmetụ aka n’ebe maọbụ n’ihe onye bu nje a metụrụ aka bịakwa metụ aka ahụ n’ọnụ maọbụ n’ime ya.

A na-ahụkarị nje ‘rotavirus’ n’ahụ ụmụaka dị afọ atọ ruo afọ ise.

Ndị karala nka, nakwa ndị na-elekọta ụmụaka nwekwara nnukwu ohere ibute nje a.

Nje ‘rotavirus’ na-efesakarị n’oge udummiri.

Njirimara ọrịa ‘rotavirus’

N’ahụ ụmụaka, njirimara nje ‘rotavirus’ gụnyere:

  • Nwata na-anyụ nsị mmiri mmiri gafee otu ụbọchị
  • Nwata na-agbọkwa agbọ ugboro ugboro
  • Nsị nwata a ga na-eji oji maọbụ nwee obere ọbara na ya
  • Ahụ nwata ahụ ga-adị ọkụ gafee selshọs iri atọ na asatọ (38.9 C)
  • Ike ọgwụgwụ, ahụ ezughị ike, nakwa ahụ mgbu
  • Ihe ngosipụta na mmiri kọrọ nwata n’ahụ: dịka ọnụ ịkpọ nkụ, ọ naghị anyụ mamịrị, anya mmiri anaghị apụta ma ọ na-ebe akwa.

Mgbe ọbụla ị hụrụ ụdị ihe a n’ahụ nwatakịrị, were ọsọ kpọga ya ụlọọgwụ.

N’ahụ ndị okenye, njirimara ọrịa ‘rotavirus’ gụnyere:

  • Ịnyụ nsị mmiri mmiri ihe karịrị ụbọchị abụọ
  • Ịnyupụ ihe mmiri ọbụla banyere gị n’ahụ
  • Ịhụ ọbara n’ime nsị gị maọbụ agbọ ị gbọpụtara
  • Ahụ ọkụ karịrị selshọs iri atọ na itoolu (39.4 C)
  • Ihe ngosipụta na mmiri kọrọ gị n’ahụ: dịka oke akpịrị ịkpọ nkụ, ọnụ ịkpọ nkụ, anyụghị mamịrị, oke ike ọgwụgwụ, ajụ ibu mmadụ

Mgbochi ọrịa ‘rotavirus’

 

Dịka ngalaba ‘World Health Organisation’ si kwuo ụzọ kacha mma iji gbochie ibute nje ‘rotavirus’ bụ ọgwụ mgbochi.

Etu e si enye ọgwụ mgbochi ‘rotavirus’ bụ ịtụnye ya n’ọnụ.

Ugboro abụọ maọbụ atọ ka e kwesịrị inye nwata ọgwụ mgbochi ‘rotavirus’; nke mbụ bụ tupu nwata eruo izuụka iri na ise, nke ikpeazụ bụ ma nwata ruo ọnwa asatọ.

Chetakwa na oge ụfọdụ, ọgwụ mgbochi ‘rotavirus’ nwereike ịkpatara nwatakịrị ka o nwee ụdị ihe ngosipụta ya bụ ọrịa.

Nke a anaghị eme oge niile, mana ọ bụrụ na ị chọpụta na nwa natara ọgwụ mgbochi ‘rotavirus’ malitere nyụwa nsị mmiri mmiri maọbụ gbọwa agbọ, biko kpọgara ya dọkịnta n’oge.

Mgbochi ndị ọzọ

Ụzọ ọzọ ị ga-esi chekwaa onwe gị ma gbochie ‘rotavirus’ bụ ịkwọcha aka gị oge niile ma ị gachaa mposi, ma i hichaa nsị nwatakịrị, nakwa ma i hichaa agbọ nwatakịrị gbọrọ.

Gbaa mbọ na-eji mmiri na ncha na-ehicha okirikiri ebe nwa gị na-anọkarị iji gbuo nje ọbụla dị ebe ahụ.

Sachaa ihe ọbụla ị chọrọ iri nke ọma tupu i rie ya; n’ihi na nje ‘rotavirus’ na-esikwa na nri adịghị ọcha efesa.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.