Take a fresh look at your lifestyle.

2023: Otu na-akwado PDP na onye na-azọ ọkwa onyeisiala na ya.

Sussan Ozo dere ya.

0 242

 

2023: Otu na-akwado PDP onye ga-azọ ọkwa onyeisiala.

Otu Coalition of South East Support Groups maka onye na-azọ ọkwa onyeisiala nke Peoples Democratic Party, PDP, Alhaji Atiku Abubakar, ekwuola na ya bụ naanị usoro ndi Igbo nwere ike iji nweta ọkwa onyeisiala.

Onye nchịkọbata otu  ahụ bụ Chief Ejikeme Odumegwu kwuru nke a n’Enugwu ka ọ na-emepe otu paati a jikọrọ ndịda ọwụwa anyanwụ  na Steeti Enugwu.

Odumegwu gwakwara ndị otu PDP niile nọ na South East ka ha dịrị n’otu ma wepụta Atiku Abubakar n’afọ 2023, ma kwusie ike na site n’ịzọ ọkwa ya, ha nwere ike imezi ihe ọjọọ na iweghachi udo na ọganihu n’obodo ahụ.

Odumegwu gwakwara Ndigbo ka ha ghara itufu ikike ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha n’ime mkpamkpa ndọrọndọrọ ọchịchị na-enweghị nhazi na oke iwe nke oge a, kwusie ike na Atiku bụ naanị ohere ịzọ ọkwa onyeisiala Igbo n’afọ 2027.

Leave A Reply

Your email address will not be published.