Take a fresh look at your lifestyle.

IHE NDI IGBO NA-EFEKARI.

CHIGO dere ya.

0 580

NKWENYE  OFUFE  NDI IGBO.

IHE NDI IGBO NA-EFEKARI BỤ:

1)CHUKWU

2)NDIICHIE

3)MMỤỌ NDI ỌZỌ.

NDI IGBO KWENYERE NA CHUKWU :ha were ya dịka mmụọ kacha mmụọ niile.Nke a mere ha ji akpọ ya CHIUKWU ya bụ chi nke kacha chi niile.

O nwere aha ọzọ ha na-etu ya, ha bụ ndi a:Onyeokike,Osebuluwa ya bụ onye na-echekwa uwa na Chineke dgz.

Etu ndi Igbo si ahụta Chukwu.Ha n’ahụta ya dika

1)Onyeokike

2) Ọ nọọzu ebe niile

3)Ọ na-achịeluigwe na ụwa.

4)Ọ kacha chi niile.

5)O nwere obi oma.

2)NDIICIE

Dịka ọ dị na-ekpemekpe ọdinala ndi Igbo,nke a bụ ndị nna nna anyị nwụrụ anwụ.Ha biri ezigbo ndu n’uwa ma nwụka ezigbo ọnwụ.

Ndi esoghi na ndi ichie bu ndị nwụrụ ọnwụ ọjọọ dịka ndi afo toro,ndi kwụrụ ụdọ dgz,ndi amụtaghị nwa ndi kpara nsi na ndi mere nsọala.

Onyeichie na Arụsi

Ndi Igbo na-akpoku ndiichie oge ọ bụla ha ji oji ekpe ekpere nakwa mgbe ha na-eme mmemme dịka emume iri ji ohuru.

3)Mmụọ ndi ọzọ ha na-efe bụ Arụsi ma ọ bụ agbara,chi dịka Amadioha, ogwugwu na arobunagu dgz.Mmụọ ndi ọzọ bụ ala na mmụọ mmiri.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *