Take a fresh look at your lifestyle.

Etu e si tigbuo Alika Ogorchukwu n’Italy

0 712

Ndị uweojii mba Italy anwụchiela nwoke a sị na ọ bụ ya ji aka tigbuo nwa afọ Naijiria na mba Italy nna ngwucha izụka.

Akụkọ kwuru na otu nwoke onye mba ahụ a kpọrọ Filippo Claudio Giuseppe Ferlazzo, gbara afọ iri ato na abụọ tigburu Alika Ogorchukwu n’anya ọcha n’etiti ehihie n’ihu igwe mmadụ na e nweghi onye gbataara ya ọsọ enyemaka.

Kama ịzọ ya, ndị mmadụ no nso na-ese ya onyonyo ka a na-akụ ya ihe.

Nwunye ya bụ Charity Oriachi kwuru na “ihe m chọrọ n’ọnwụ dị ya bụ “Ihe m chọrọ bụ ikpenkwụmọtọ.”

Ọ kọwara na “Ogorchukwu na-ere ihe n’okporoụzọ dịka a chụrụ ya n’ọrụ ka o merụchara ahụ ka ọ merụchara ahụ site n’ihe mberede nke ọkporụzọ. O biela mba Italy afọ iri.”

Onyeisi otu pati ‘Democratic Party’ mba ahụ bụ Enrico Letta bụ onye wepụtara aha Alika Ogorchukwu dịka onye ọdachi ahụ dakwasịrị kwuru na “o nweghị ụzọ aga-esi lewe ya bụ ihe ọ dị ntị mma.”

 

Ogorchukwu, onye gbara afọ iri atọ na itolu ma nwee ọrụsị na-ere ahịa ya na Civitanova March bụ obobo dị n’ikpere mmiri oge nwoke tigburu ya bagidere ya napụ ya igwe o ji aga ije were kụwa ya ihe.

Akụkọ kwuru na Ogorchukwu zọwara onwe ya mana nwoke ahụ tigburu ya dagiderere ya.

Onye nnochiteanya Naịjirịa na mba ahụ bụ Mfawa Omini Abam katọrọ ọnwụ Ogorchukwu ma malite inye nwunye ya na ezinaụlọ ya enyemaka.

Kemgbe ọnwụ Alika Ogorchukwu bụ onye hapụrụ nwa gbara afọ asatọ na nwunye were nwụọ, iwe agbaala ndị mmadụ n’ofesi nakwa na Naijiria.

Na mba Italy, ndị isiojii mere ngagharịiwe maka ọnwụ Ọgorchukwu ma kpọọ oku ka enye ya ikemnkwụmọtọ.

Ụfọdụ kwuru na ọ bụ nnukwu ihe ihere na a kụgburu onye isiojii na-enweghị onye nọ nso kwusịị onye gburu ya maọbụ tie mkpu ka a hapụ ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *