Take a fresh look at your lifestyle.

NGHOGBU NJEM MBIRI:NWAKPO N’ONODU NHUJU ANYA(AGBA NKE ABUO)

AMARACHUKWU NWANGUMA depụtara ya otu a n’Igbo.

0 484

NGHOGBU NJEM MBIRI:NWAKPO N’ONODU NHUJU ANYA(AGBA NKE ABUO)

AMARACHUKWU NWANGUMA depụtara ya otu a n’Igbo.

Mmechi…

N’agba nke mbu ihe nnyocha a, anyi mere ka ḷmata,ka iji mmadu

atu mgbere ahia na mmanye n’oru ike siri buru ntaramahuhu nye di

na nwunye gara njem n’Italy site na nghogbu otu nwanne ha

n’ebumnobi inweta ezigbo obibi ndu na onodu oma.

N’iweta akuko a n’isi njedebe,anyi ga-ahu oke ndoli na nhuju anya

nke nwoke a,tinyekwara nloghachite ya n’ezinaulo ya, ya na ikpa oke

sitere na nke a puta.

Obinna enweghi ihu oma dika nwunye ya bu Azuka bu onye

n’enwetachaghi ntaramahuhu site n’aka ezinaulo erisiri ya, igba

odibo.

Obinna abụrụ ohu na Saba

Eresiri Obinna nwoke ana-akpo Mudi, onye mba Arab nke ejiri iji

mmadu atu mgbere ahia mara, Mudi kpogara ya na ndi ozo n’obodo

Saba nke Libya. Mudi kwuru na onye obula n’ime ndi ohu ahu ga-

akwu ya ego di puku dinars abuo nke putara puku nari naira abuo

tupu ha enwere onwe ha.

Obinna siri na ya chere na nwoke ahu na-egwu egwu ma gwa ya na

Maazi Razaq akwuola ugwu njem ya ibanye Libya. Mudi gwara ha na

ya na- enye ha otu ubochi amara n’ihe na ha ka batachara ubochi

ahu ma doo ha aka na nti na ha ga-enye ya ego ya n’ubochi na-abia.

Oge Mudi biaghachiri echi ya, juo maka ego ya nke ha enweghi ike

inye ya,n’iwe oweputara egbe gbaa otu nwoke si steeti Edo ana-

akpo Jagaban onwuo ozugbo.

Obinna siri n’olu akwa, na ya riowara Mudi ka omere ya ebere. Mudi

nyere ha ekwenti ya ka ha malite kpowa ndi ezinulo ha ozigbo ma

obu dabaa n’oke iwe ya.

Obinna siri na ya kporo ozo, nwanne ya nwanyi bu Uju ma rio ya ka

ochotara ya ego ahu ozigbo ka aghara igbu ya.

 

N’ime oge ha na eche ezinaulo ha iweta ya bu ego, Obinna siri na

Mudi na ndi oru ya ji mma, eriri oku cable, igwe rod na osisi na-aku

  1. Otu n’ime ha onye akuru igwe n’isi gbara ara ozugbuo n’otu ntabi

anya.

Mgbe Uju nwanne ya nwaanyi kwuru ya bu ugwo, akpoputara ya ka

onwere onwe ya, ma choputa na enyi ya bu Jubril agbaala oso.

Obinna siri na akpobakwara ya n’ulo ntaramahuhu ahu ozo ma nye

ya iwu ka okwuo ugwo isi nke Jubril.

Ntaramahuhu na iti ihe ya ka amubara gboro ugboro, tutu ruo

n’abali mbu nke onwa October 2016 o sitere n’ebe a akpachiri ya

gbapu.

Naani mmadu iri n’ime mmadu iri na asaa eresiri Maazi Mudi ka di

ndu ruo n’onwa October afo ahu Obinna gbapuru.

 

Nwoke obi oma a gara n’iru nyee Obinna ndumodu ka o gbagaa

n’obodo Tripoli bu ebe n’enwechaghi ohere ndi ntoro mmadu.

Uju nwanne ya kwukwara ego ruru puku naira iri ise bu nke otu

nwafo mba Gambia ji hazie njem ya n’ obodo Tripoli.

Ndọli na Mkpagbụ

Iji gbanahu njide n’aka ndi zuru ya, nwafo Gambia nwere Obinna

ndumodu izaghari aha. Ozugbuo Obinna azawazie Jimmy South.

O were ha abali isii iji gafee ozara Tripoli bu nke kwesiri iwe nani

awa ato. Ka erutere n’obodo Tripoli Obinna enweghi ike inweata

Emeka nwanne ya ma o bu Razaq n’ekwe nti.

O rituru n’ogige ugboala n’akwusi ebe otutu mmadu juputara ma

n’akpaghari dika aturu enweghi onye nche tutu ruo oge ndi uwe ojii

jidere ya ma kpochie ya.

 

Ka abali ato gasiri onweghi onye biara juo ase igbaputa ya, ndi uwe

ojii toghapuru ya obanyekwa n’okporo uzo ebe ozutere Ejike nwafo

ala Niajiria onye kpobatara ya n’oru ona aru bu isa ugboala .

(Insert Obinna’s picture in Martyrs square in Tripoli)

Oruru oru n’ebe ahu malite n’onwa October ruo December afo 2016

iji kpakoba ego oji gawa mba Italy site na osimiri Mediterranean

mana Ejike duru ya odu ka ochere ruo onwa March oge mmiri ahu

ga atalata. Obinna banyere ugbommiri ana-akpo Lampalampa

n’onwa March afo 2017 iji gafee osimiri Mediterranean.

Ngwa ngwa ugbo ha puru, ndi uwe ojii no na nnchocha jidere ha ma

hu ogwu ike n’ahu otu onye njem. Anwuchiri ha ma kpuga ha n’ulo

nga Tareq Ashooq Detention center di n’obodo Saladin nke mba

Libya. Ka onwa ise gasiri n’enweghi ebubo obula, otu onye nche

n’ulo nga juru ya ma o ga-amasi ya iruru otu nwaanyi mba Libya oru

odibo.

N’abali iri abuo na ano nke onwa August afo 2017, akpogara ya otu

nwaanyi onye mba Libya onye ji ya kwara ngwa akwamiko.

Obinna kwuru n’ihe ndia gwuru ya ike mere oji kpawa nkata etu o

ga-esi gbapu.

Otu enyi ya n’uloakwukwo ahu nyere ya ekwenti oji kpoturu

nwunye ya n’akara Facebook, nkea bu nke mbu ,ya na nwunye ya

na-ekwurita kemgbe ndi ojoo ahu kewachara ha abuo.

Ojikwa ohere ahu kpoturu ndi enyi ya no na Tripoli bu ndi nyere ya

aka isi n’ulo nwaanyi ahu gbapu.

Oge orutere na Tripoli, ndi enyi ya gwara ya na nwaanyi ahu bu onye

amara nke oma,na o ga-achoghariwa ya. Ha kwadoro ya, ka ogbaga

mba Italy.

 

Ha nyere ya ego di otu puku dinars ma nyefee ya n’aka onye zupuru

ya n’obodo Tripoli. O gawara obodo Zuwara di n’akuku mmiri mba

Libya.

N’abali iri na asaa nke onwa November afo 2017, Obinna banyere

ugbommiri Lamalampa nke ugboro abuo ije mba Italy.

Ka o gasiri awa ano n’ime osimiri a, ugbommiri bu nke kwesiri ibu

mmadu iri na asato mana buruzie otu nari mmadu na iri ise na isii

rutewere Tunis ka engine ya mmunyere oku ma tuba ndi njem niile

n’ osimiri.

(Video of Obinna showing scares from the fire incident)

Mmadu iri asato na asaa putara ndu site n’ihe mberede oke osmiri a

jiri ukwu banye n’ime ozara Tejulu gaa ije n’ime abali ano , iji

gbanari nwuchi ndi uwe ojii.

Ha nwere ihu oma ikpokwuru otu nwafo mba Gambia buuru ha ga

n’odu ahia ya ma nyere ha aka tinye ha n’ugboala na-agaghachi azu

na Tripoli.

Obinna echeta Ụlọ

Ka afo abuo gasiri, n’aguu, ihe mgbu, nwuchi kwa mgbe, kwa mgbe

na-enweghi ike irute Mba Italy, Obinna chetara ulo ebe aguu

iloghachite ala Naijiria malitere guba ya.

Ndi enyi ya gwara ya na-enweghi ugboelu na esi Libya aga ala

Nigeria beluso ugboelu ndi achuchighara azu nke International

Organisation on Migration (IOM). O gara n’ulo oru Embassy ala

Nigeria di na Tripoli na nke mbu ya n’onwa November afo 2017

idenye aha ya na ndi aga akpoghachi azu.

Mgbe ochere ruo onwa February afo 2018 na-enwetaghi osisa obula,

aguu iba mba Italy ozo banye ya n’isi nke ugboro ato.

Ntụghari Ụche

 

Obinna kwuru na ya edokotala ego ma diri njikere iga mba Italy.

N’abali tụpụ ha kwadoro ipụ, ndi ụwe ojii wakporo ụlọ ikwuu ha.

Ejidere Obinna ma kpọga ya n’ụlọ mkpọrọ ọzọ di na Zawiya State,

ebe atara ọtụtụ ha ahụhụ, gbuo ụfọdụ, ma gbụpute akụkụ ahu ndi

ọzọ a ga-ere ere

Oge ruuru mgbe ulo mkporo ahu juru n’onu bu nke kpatara eji

kpoga ufodu n’ulo mkporo ozo. Obinna so na ndi akpogara n’ulo

mkporo ozo di na Zintan.

Ebe onogo mkporo otutu onwa, Obinna siri na ya n’asuzi asusu Arab

nke mere ejiri mee ya otu n’ime ndi n’elekota ndi mkporo ozo.

Enyere ha oru ike nri, akwa na ihe ndi ozo nye ndi mkporo ibe ha.

N’agbanyeghi okwa ohuu ya, obi adighi ya mma. Okpebiri n’obi ya ga

tinye akwukwo n’onwa May afo 2018 ilaghachi ala Nigeria.

O so n’ime otu nari mmadu na iri isii akpoghachiri azu n’ala Naijiria

n’ime nari mmadu ato tinyere aha ha n’akwukwo.

Nlọghachi n’ụlọ

N’abali ise nke onwa June afo 2018, Obinna laghachiri ala Nigeria

site n’ugboelu IOM.

Onyeozi nwuru anwu bu T. B. Joshua nke ulo uka Church of All

Nations nabatara ha oge ha rutere odo ugboelu Muritala Muhammed

di na Lagos. Ulouka ahu mere ka ha koro uwa dum n’onyonyo

Emmanuel TV ha, okachasi ndi na-acho ime njem n’enweghi

akwukwo ikikere ihe na-esi na nkea aputa.

Dika o si kwuo, TB Joshua nyere ha ego ha ji malitegharia ndu .

N’ihi ihere na nkocha, Obinna anaghi aputa ezi otutu onwa iji

gbanaghari ikwa emu nke ndi enyi na ikwunibe ya.

Mana taa, ya na ndi ozo laghachiri azu site na njem nghogbu mbiri

noo n’Abuja eguzobela otu ana-akpo “Migrants Lives Matters”ma jiri

 

ohere a na-akuziri ndi mmadu ihe ojoo di na ime njem n’uzo ezighi

ezi na itu mgbere ahia mmadu.

Ihe Kpatara ndi mmadu ji aga njem n’ejighi akwụkwọ ikikere

(Insert Logo of NAPTIP)

Ulo oru National Agency for the Prohibition of Trafficking in Persons

(NAPTIP) n’ala Nigeria na- ekwu na ndi mmadu ime njem di otu a bu

n’ihi amaghi ihe na ida ogbenye.

Onye Director ulo oru NAPTIP nagalaba ikuziri ohaneze ihe, bu

Josiah Emereole kwukwara n’ihe na ebute udi agwa a bu oke

ochicho, nkwanye ndi ogbo na mmepe.

Ogbara ndi ntorobia ume ka ha ghara ikwe ka aghogbuo ha n’ibanye

na mba ozo site na nkwa inye ezigbo ndu na oru na- emeghi nnyocha

site n’usoro goomenti weputara.

Julie Okah-Donli, onyeisioche nke ulo oru NAPTIP n’oge gara aga ma

burukwa onyeisioche otu United Nations Voluntary Trust Fund for

Victims of Trafficking in Persons (UNVTF)kwuru na iluso njem n’uzo

a na iji mmadu atu mgbere ahia bu oke na oru diri onyeobula.

(Insert Logo of Symbols of Hope Project)

Ulouka Lutheran Church of Christ n’ala Nigeria malitere otu atumatu

ana-akpo “Symbols of Hope Project” na-esonye n’ibu agha megide iji

mmadu atu mgbere ahia na ime njem n’uzo ekwesighi ekwesi

kemgbe afo 2017. Onyeisi ha n’ala Nigeria bu Rev. Emmanuel

Gabriel mere ka amata na otu a bu Symbols of Hope akwadola ihe

ruru ndi lotara njem mmadu nari ano si mpaghara ala Nigeria di iche

iche, na-azu ha n’aka oru , enye ha ego mmalite ahia na aka oru ndi

ozo, nkwado ogugu isi sitere n’aka ndi okachamara nakwa ime ka

ohaneze mata ihe banyere udi njem a.

 

Ezi nwocha na agbamume nke ndia loghachitere site na njem di

otua, ga-enye aka nke ukwu ikwalite mmuo na inwe ezi nchekwube

na olileanya nke ndi gabigara na nghogbu njem mbiri na mba

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *