Take a fresh look at your lifestyle.

A zọpụtala ọtụtụ ndịagha Yukren tọrọ n’Azovstal

0 620

Mba Yukren ekwupụtala na a zọpụtala narị kwuru narị ndịagha ha tọọrọ kemgbe ọnwa abụọ n’ ụlọọrụ mmepụta igwe a kpọrọ Azovstal dị na Mariupol.

Osote Minista nchekwa mba ahụ bụ Hanna Maliar kwuru na e bughara ndịagha iri ise na atọ merụrụ ahụ obodo Novoazovsk bụ ebe ndị agha nnupisi Rọshịa ji.

O kwukwara nari abuo iri na otu ọzọ bụ ndị e bugara Olenivka nke bụkwa obodo ndị nnupuisi ji.

Rọshịa kwuburu na e nwere nkwekọrịta iji nye ohere ka e bupụ ndị merịụrụ ahụ.

Ihe dịka ụgbọala bọọsụ dị iri na abụọ ka e jiri bupụ ndị agha Yukren tọọrọ n’ime ụlọọrụ mmepụta igwe ahụ bụ ebe Rọshịa wakporo, dịka Reuter si kwuo.

Ụlọntaakụkọ nke gọọmentị Rọshịa gosiri ihe onyonyo ebe a na-ebupụ ndị aha ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *