Take a fresh look at your lifestyle.

Philippines amalitela ntuliaka iji họpụta onyeisiala ọhụrụ

0 108

Mba Philistine  amalitela ime ntuliaka-elu iji họpụta  onyeisiala ọhụrụ taa bụ Mọnde nakwa mmadu puku iri asatọ bụ ndi ga eji ọkwa gọọmenti di icheiche.

Ndi aga ahọpụta bu osote onyeisiala, Sinatọ iri na abụọ,ihe kariri mmadu nari atọ bụ ndi ụlọ nzụkọ House of Representatives nakwa ihe kariri mmadu puku iri na asaa bụ ọchichi nta.

“Ọnụ ọgụgụ ebe ana atụ votu di 37,211 polling centres gba gburugburu ala anyi,bụ nke ga emepe ma ọkụọ elekere isii maka mmadu 65.7 million tozuru oke itu votu ma mechie n’elekere asaa nke uhuruchi.”

Gọọmenti ezipula ndi agha ọnụ ọgụgụ ha di 45,000 na ndi uwe ojii 60,000 maka ihu na enwere udo dika ana eme ntuliaka-elu a. Gbakwunyere ndi uwe ojii di 12,000 bụ ndi nọọ maka ọbụrụ na nsogbu daputa n’ụfọdu ebe.

Leave A Reply

Your email address will not be published.