Take a fresh look at your lifestyle.

Etu ndị ntọọ si toro ọtụtụ mmadụ n’ụgbọ oloko n’aga Kaduna

0 424

Akụkọ na-ekwu na-atọrọla ọtụtụ mmadụ na-eme njem ebe egburu otu onye n’ụgbọ oloko si Abuja aga Kaduna na mgbede Monde.

Anya hụrụnụ na-ekwu na ya bụ ụgbọ oloko si n’okporo ya fepụ mgbe ihe ana amaghị gbawara na ya bụ ụgbọ oloko.

Akụkọ kwuru na e nwere ndị nwụrụ mgbe ọdachị a mere ma nwekwa ndị merụrụ ezigbo ahụ.

A wakporo ụgbọ oloko ahụ bu mmadụ otu puku (1000) n’elekere asatọ nke mgbede ụnyahụ bụ March 28, 2022.

Ugbua emechiela ụgbọ oloko isi Abuja gawa Kaduna nakwa isi Kaduna gawa Abuja n’ihi mwakpo a.

Ndị ụlọọrụ ‘Nigerian Railway Corporation’ (NRC) ziteere ndị njem ozi ahụ site n’akara social midia.

Ndị na-eme njem nakwa ufọdụ ndị ezinaụlọ ha gwara ndi nta akụkọ na ọdachị a abụghị obere ihe nakwa na ha amabeghị kpọmkwem mmadụ ole ihe a metụtara.

Otu onye na-eme njem kwuru na mgbe ụgbọ oloko ahụ kwụsịrị na ndị oji egbe gbara ya okiri okiri ma gbawa egbe .

N’ọnụ ya, ‘ndị mmadụ tukwuru ala ma chọwa ebe nzuzo dịka ndị omekome kpudewere nso n’ụgbọ oloko ahụ, gbawa ndị mmadụ egbe ma tọrọ mmadụ olemole agụtaghị ọnụ .”

” Anyị na-aga ụzọ nụ ihe gbwaranụ , dịka ogbunigwe ma nụkwa ụda egbe , ndị na-eche ụgbọ oloko anyị nche nakwa ndị omekome ahụkwakọrịtara mgbọ mana chukwu zọrọ anyị bụ na ndị nchekwa ekweghị ka ndị omekome napụ ha ike mana ndị omekome torọ ụfọdụ ndị mmadụ n’ụgbọ ooko ahụ.” dịka o siri kwuo.

Onye ọzọ hụrụ mgbe ọdachị a mere kwuru na enwere ndị nwụrụ n’ọdachị a.

Kọmishọna na-ahụ maka nchekwa ime obodo na Kaduna bụ Samuel Aruwan kwuru n’akwụkwọ ozi o depụtara na e zipụla ndị agha ka ha ga gbapụta ndị ahụ na-eme njem n’ụgbo oloko a ma buga ndị merụrụ ahụ n’ụlọ ọgwụ dị nso maka nleta ndị ọrụ ahụike.

Ọ bụkwa maka ọtụtụ mwakpo na ntọrọ na-eme n’okporoụzọ Abuja- Kaduna mere ka ọtụtụ mmadụ na-ejizi ụgbọ oloko eme njem.

Mana nke a bụ mwakpo nke abụọ n’ụgbọ oloko na Naịjirịa dịka ọnwa isii gaferela.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *