Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmentị Anambra agbagharala ma nabata Igwe Neni

0 406

Gọọmentị Anambra steeti agbagharala ma nabata Igwe Neni bụ nke akwụsịrị ọrụ n’ike.

Nke a pụtara n’ozi nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Christian Aburime binyere aka dịka aka na-achị steeti ahụ bụ Chukwuma Soludo nakwa ndị Igwe odinani gafere iri na itoolu nwere nzụkọ n’Ọka.

Soludo kọwara na ihe mere o ji mee ihe o mere ụfọdụ ndị Igwe achụrụ n’ọrụ na ndị ọzọ agbara ajụjụ ọnụ bụ iji debe iwu ala ka ọ ghara imebi.

Ihe ndị ọzọ ha kpara na ya bụ nzụkọ bụ usoro a ga-esi kpokọ otu ọhụrụ maka ndị Igwe ọdịnala na steeti ahụ.

N’aka nke ya, Obi na-achị Ọnịcha bụ Igwe Nnaemeka Achebe kwuru na ha kwudosiri Soludo na-azụ ma kwuo na ha dị njikere iso ya jikọọ aka maka ọdịmma steeti ahụ.

A gbaghara Igwe Ojoto nakwa Igwe Aguluezechukwu bụ ndị agbaburu ajụjụ ọnụ.

Ihe Ifeanyi Ubah sara Soludo maka ịkwụsị Igwe a ọrụ

Sịnetọ Ifeanyi Ubah na-anọchiteanya Anambra South n’ụlọomeiwu Naịjirịa agwala Gọvanọ Chukwuma Soludo nke Anambra Steeti ka ọ kwụsị ịbụlite nzuzu ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’Anambra.

Nke a na-abịa dịka Gọvanọ Soludo kwụsịrị Igwe Neni bụ Damian Ezeani ọrụ n’ihi na o chiri Ifeanyi Ubah echichi ‘Ikemba Ojoto’.

Na mkparịtaụka Ubah na ndị ntaakụkọ Authority FM dị na Nnewi nwere na Mọnde, O kwuru na ọ chọbughi itinye ọnụ n’okwu ahụ kama na ọ chọrọ ka o doo ewu na ọkụkọ anya.

O kwuru na ọ bụghị echichi e chiri mmadụ na-egosi na a maara onye ahụ ama kama na ọ bụ site n’ọrụ onye ahụ na-arụ.

“O nweela mgbe ndị Eze ọdịnala mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ Southeast Council of Traditional rulers chọrọ ichi m echichi, mana m jụrụ ajụ.

“Ọ tụrụ m n’anya mgbe m nụrụ na a gọvanọ kwụsịrị Igwe Ojoto ọrụ maka na o chiri m echichi ‘Ikemba Ojoto.

“Ana m arịọ Soludo ka ọ kwụsị ịgbalite nzuzu ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’Anambra Steeti na gọọmenti nwere ọtụtụ ọrụ cheere ya n’ihu ọ kwesịrị ileba anya.”

Sịnetọ Ubah gara n’ihu kwuo na Onyeisi ndị Eze ọdịnala n’Anambra adịla mbụ katọọ nkwụsị n’ọrụ ahụ site n’akwụkwọ ozi ha degaara gọvanọ Soludo

Akwụkwọ ozi Obi Onicha degaara Soludo maka ịkwụsị Igwe Neni ọrụ

Onyeisi ndị eze ọdịnala n’Anambara steeti mabụrụkwa Obi Onicha bụ Igwe Alfred Achebe akatọọla aka ọchịchị Charles Soludo ji eso ndị eze ọdịnala n’Anambara steeti.

Nkatọ a na-eso nkwụsị n’ọrụ Gọọmentị Anambara steeti akwụsịrị Igwe nneni bụ Igwe Damian Ezeani ọrụ nwa obere oge maka ichi Senetọ Ifeanyi Ubah echichi.

N’akwụkwọ ozi nke Igwe Achebe binyere aka ma zigara Kọmishọna na-ahụ maka ihe metụtara echichi ọdịnala bụ Collin Nwabunwanne, o kwuru Gọọmentị steeti ahụ ji nwayọo akpụ ugwu ndị eze ọdịnala n’ala.

O kwuru na akwụkwọ usoro agwa kwesịrị onye eze(Code of Conduct) bụ ndị eze gbakọrọ aka mee ya bụ iwu ka ọ na-achị ha.

O kwuru na ha na-ahụ na onye Eze ọbụla gbasoro iwu ahụ, onye ọbụla dara iwu ahụ, ha atụnye gọọmentị ọbụla nọ n’ọchịchị alo ntaramhụhu kwesịrị.

“Mana ugbua ọ dị ka gọọmentị ugbua ji aka ha ahazi iwu ji ndị eze na-ajụkwaghị otu ndị eze bụ mere ya bụ iwu.”

Ọ sịrị na nkwụsị n’ọrụ a kwụsịrị Igwe Ezeani agbasoghị usoro dị n’iwu ndị eze ọdịnala steeti ahụ.

Ana m eche n’ akwụkwọ ozi e sitere m nke rutere m aka ka ọ gacharala awa iri abuo na ano akwụkwọ ozi e jiri kwụsị lgwe Damian Ezeani ọrụ wuwerela na soshal midia n’abalị Asatọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2024 bụ iji mezuo iwu.”

Igwe Achebe onye gbarụrụ ihu n’olu Kọmishọna ji dee akwụkwọ ozi ya, siri na ụdị etu e si soo ya maka okwu ichi Ifeanyị Ụba echichi na-arụtụ aka na ikekwe o “nwere ihe ọzọ Igwe Neni maọbụ Ifeanyi Ubah mere’ na-ese.

Etu Soludo si kwụsị Igwe Neni ọrụ n’ike

Na mgbede ụbọchị Tuzde, ọ pụtara ihe na Gọọmentị Anambara steeti akwụsịla ịhụ Igwe Damian dịka Igwe obodo dịka a kwụsịrị ya ọrụ obere oge.

N’ozi nke Komishona na-ahụ maka okwu ọdịnala wepụtara, ọ kọwara ihe nke a ji me.

N’ozi ahụ, ọ sị na Igwe Neni dara iwu kpuchiri omume ndị Eze ọdịnala.

Ozi ahụ kwuru sị, “Iwu kpuchiri omume ndị Eze ọdịnala kwuru na o nweghi onye nwere ikike ichi onye esighị n’obodo ya echichi na-anataghị Igwe obodo onye ahụ a na-echi echichi ikike ime nke ahụ.”

Ozi ahụ kwukwara na e kwesiri ịnata ngalaba na-elekọta ihe ọdịnala na steeti ahụ ikike tupu e mee nke a.

“Na ị gara n’ihu chie mmadụ esighị n’obodo gị bụ Sịnetọ Ifeanyi Ubah echichi ezughị oke na-agbanyeghị ihe ọbụla iji mee ya.”

Ihe a bụ nkọwa gọọmentị Anambra nyere ha ji kwụsị ya n’ọrụ obere oge.

Ha nyekwara ya ohere ịzara ọnụ ya ma zọọ isi onwe ya na mkpebi a.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *