Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị ekperima ahụ gburu Nabeeha atọhapụla ụmụnne ya ise

0 212

Ndị ekperima atọhapụla ụmụaka ụmụnwaanyị ise n’ime isii ha tọọrọ n’obobo Bwari dị n’Abuja bụ isi obodo Naịjirịa.

Nke a na-abịa dịka ndị ekperima gbuchara otu nwata n’ime ndị a tọọrọ nke aha bụ Nabeeha n’izuụka gara aga.

Ogbugbu Nabeeha butere ọtụtụ okwu n’etiti ndị Naịjirịa ọkachasị n’ihe banyere nchekwa na ntọrị ndị mmadụ na mpaghara Abuja.

Ndị ezinaụlọ Nabeeha gwara ndi ntaakuko na ọ bụ eziokwu na ụmụaka ise ndị ahụ alọghachịla n’ụlọ ha n’abalị iri abuo, Satọde nke onwa Jenụwarị, 2024.

N’otu aka ahụ ihe onyonyo gosiri mgbe ụmụaka ndị a lọtara na-efegharị na soshal midia dịka ndị mmadụ na-enwe aṅụrị maka ntọhapụ ha.

Ndị uweojii Naịjirịa kwuru na ha gbapụtara ụmụaka ndị a site na mwakpo ndị otu ha mere n’oke ọhịa Kajuru nke dị na Kaduna Steeti n’ihe dịke ọkara gafee elekere iri na otu nke abalị Satọde ahụ.

Ozi si n’aka ọnụ na-ekwuru ha bụ Josephine Adeh pụta kwuru na ụmụaka ndị a ezutela nne na nna ha n’Abuja ma sị na ha ebulitela ọnọdụ nchekwa na mpaghara Bwari nakwa ebe ndị ọzọ dị n’Abuja.

Cheta na ndị ekperima wakporo ezinaụlọ Nebeeha ma tọrọ ya, ụmụnne ya ise nakwa nna ha na Tuzde ụbọchị abụọ nke ọnwa Jenụwari 2024.

E mechara tọhapụ nna ya ma si ya ka wete ego o ji agbapụta ụmụ ya bụ nke butere ogbugbu Nabeeha mgbe nna enweghi ike iweta ego ahụ n’ụbọchị ha nyere ya.

Oke ntọrị ndị mmadụ na-aga n’ihe kamgbe na-emetụta ọtụtụ obodo dị na mpaghara Ugwu nke Naịjirịa na-agbanyeghi mbọ ndị ọrụ nchekwa na-agba iji kwụsị ya.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *