Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmentị Oyo steeti amalitela inyocha ihe gbawara n’Ibadan

0 176

Gọọmentị Oyo steeti amalitela inyocha ihe gbawara na steeti ahụ na mgbede ụbọchị Tuusde.

O dobeghi anya ihe ọ bụ mana akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu maka ihe gbara dịka ogbunigwe n’Ibadan dị na steeti ahụ.

Ha kwuru nke a n’akara X bụbu Twitter ha ma na-arịọ ndị mmadụ ha nọrọ nwayọ dịka nyocha na-aga n’ihu.

Ndị mmadụ na-ekesa ihe onyonyo dị icheiche igosi ahụmihe ha gbasara ihe ahụ gbara.

Otu onye gosiri etu glassị niile dị n’ime ụlọ ya dara n’ala dịrị n’iperipe.

Onye ọzọ gosiri ihe onyonyo ebe anwụrụ ọkụ dị ojii na-apụta otu ebe n’ike n’ike dịka ndị mmadụ na-agba ọsọ.

Ndị uweojii Oyo steeti azabeghi ekwentị ha rue ugbua a na-ede akụkọ a.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *