Take a fresh look at your lifestyle.

Ebughariela ikpe Godwin Emefiele

0 263

Ọkaiwu Godwin Emefiele kwuru ụbọchị Tuzde na nwa amadi ahụ bụbụ Onyeisis Ụlọakụ Etiti bụ CBN enwebeghị ndị akaebe ga-akwụdoro ya.

Ụlọikpe Ukwu nke Abuja ebugala ikpe maka ebubo nrụrụaka e bọrọ onye bụbu Gọvanọ nke Central Bank of Nigeria (CBN), Godwin Emefiele gaa abalị 18 na 19 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2024.

A na-ekpe Emefiele ikpe maka ebubo imefu ego ruru otu ijeri naira na ụma isii (N1.6Bn )n’ịzụ ụgbọala.

Emefiele gọrọ ebubo e boro ya ma sị na aka ya dị ọcha.

Ụlọikpe nyere Emefiele ohere isi n’ụlọ na-abịa mkpe ya n’abalị Nọvemba 17, 2023 ma sị ya kwụọ ego dị N300m, ma weta ndị akaebe mmadu abụọ, ma kpọchie ya n’ụlọ mkpọrọ Kuje, rụọ mgbe ọ zutere ọnọdụ mgbapụta ya.

N’okwu ikpe ya maliteghachiri, onye wetara ikpe ahụ mabụrụkwa onyeisi ụlọ ọrụ ‘Corporate Affairs Commission (CAC) gwara ụlọikpe na Emefiele abụghị onye nwe ya ma ọ bụ onye nwe ụlọ na April 1616 Investment Limited, nyere CBN n’ịkwanye ụgbọala N1.2bn mgbe Emefiele nọ n’ ọche.

Onye ọkaiwu EFCC bụ Rotimi Oyedepo duru ya n’ihe akaebe mgbe ọ na-enye ọtụtụ akwụkwọ gbasara etu esi weba ụlọọrụ ahụ n’August 1, 2016.

Ọ gụpụtakwara aha ndị nwe ụlọọrụ ahụ nke gụnyere Aminu Yaro, Maryam Abdullahi na Saadatu Yaro.

Ọkaiwu Emefiele, Mathew Burkaa, onye jụrụ ikwu okwu na igwe foto, kwuru na Emefiele emezubeghị ọnọdụ mgbapụta ya.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *