Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe mere Minista si kpụpụ di na nwunye ụlọikpe n’Enugwu

0 721

Minista na-ahụ maka ụmụ nwaanyi bụ Uju Ohanenye akpụpụla dị na nwunye ụlọikpe n’Enugwu maka imetọ nwa ha gbara afọ itoolu

N’akwụkwọ e jiri gbaa di na nwunye ahụ akwukwo n’ụlọikpe ‘Enugu State High Court’ n’abalị iri na asaa nke ọnwa Novemba ka ha wepụrụ ikpe ahụ ụlọ ikpe. nke akara ya bụ ‘Suit No E/987/2023′ nke agbara, ebubo a na-ebo ha bụ na, n’agbata otu afọ na ọnwa isii site Janụwari 2022 rue June 2023, ka di nne nwata ahụ( step father) – anyi akpọghị aha di na nwunye ahụ maka nchekwa ha- malitere wakpowa nwatakiri ahụ n’ụlọ ha dị n’ Onoh Crescent GRA, Enugwu.

E so kpupụ nne mụrụ nwata ahụ ụlọikpe n’ihi na naoge ọ matara na di ya na-emetọ nwaanyi ya, echekwaghị nwa ya nwaanyị na-agbanyeghị na ọ gbara naanị afọ itoolu.

Dọkinta nyochara nwata ahụ bụ Dkta Samuel Ndukwe nke ụlọọgwụ ndị Uweojii ‘Police Clinic Enugwu kwuru nchọpụta gosiri na a akwasola nwatakịrị ahụ ikọ n’ike ugboro ugboro dịka o gosiri n’ahụ ya.

Onye ọkaiwu na-ekwuchitere Mịnịsta Uju Ohanenye bụ Chuma Oguejiofor kwuru na ebumnobi ikpe ahụ bụ iji chekwaa ikike dirị nwatakiri ahụ dịka mmadụ, nakwa igosi na akparamagwa ahụ bụ nke kwesiri ka a taa ndị niile aka ha dị na ya nnukwu ahụhụ.

Minista Ohanenye kwuru na ihe na-ewute ya bụ na kemgbe e jidechara di na nwunye ahụ ma hapụ ha, ha kpọkwara nwatakiri ahụ laghachi ọzọ n’ụlọ ha ga biri.

“E kwesiri ka ha na nwatakịrị ahụ ghara ibikwa ọzọ ma ọ bụ nwee mmekọ ọbụla ganye na o ruo afọ ogụ na otu.

Minista ahụ rịọkwara ụlọikpe ka ọ kpọnye ha nwa hụ ka ha zụba ma mee ka nne na nna ya kwụọ ya ego iti aka n’obi ga-adị nde naira iri (10million naira) nke bekee kpọrọ, “Damages”.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *