Take a fresh look at your lifestyle.

Pope achụọla otu Bishọpụ n’ọrụ

0 478

Onyeisi ụka Katọlịk bụ Pope Francis achuola otu Bishọpụ a n’ọrụ maka ikwugide nhazia=gharị ụfọdụ Popu na-eme.

Bishọpụ Joseph Strickland na-elekọta Diocese of Tyler anya katọrọ Pope maka atụmatụ Pope wepụtara nke na-akwado ihe ndị ejighị mara ụlọụka Katọlịk dịka ọlụlụ nwoke na nwoke inke Bkee akpọrọ ‘’same sex marriage’’, iwepụ afọime, nke ndi oyibo kpọrọ ‘’Abortion’’ nakwa mmadu ịgbanwe onwe ya nke a kpọrọ ‘’transgender’’ .

N’ọnwa Julaị, Joseph kwuru na a na-agbanwe usoro nile e jiri mara ụlọụka Katọlịk, na Chukwu keputara alum di na nwunye ka ọ bụru ihe dị n’etiti otu nwoke na otu nwanyi na-abughị nwoke na nwoke ibe ya maọbụ nwanyi na nwanyi ibe ya.

Tụpụ a chuo ya, e nyere ya ohere iji aka ya pụọ,mana ọ juru aju.

Bishọpụ Joseph kwuru, ‘’E nweghị m ike ịhapu ọrụ ụka, maka na ihe ọ pụtara bụ ịhapụ ụmuaturụ Chukwu hanyere m na-aka.’’

Ihu na ụka Katọlik na-aga n’usoro mbaụwa, Pope mara ọkwa ubochị Tọzde na a ga-ebido mebe ndi gbanwere onwe ha(transgender) mmirichukwu n’ulọụka ma ọburu na ọ gaghị ebute nsogbu maọbu mgbagwoju anya.

Pope kwuru na ọ chụchụ ọ chụrụ Bishọpụ Joseph si na mpụtara nnyocha e mere n’ulọụka ebe ọ na-elekọta bụ ‘’Diocese of Tyler’’ nke gosiri na ọ naghị elekọta akụnaụba ụlọụka ahu nke oma, na e nwere ihe ndi na-adịghị ka o siri kwesi.

Pope kwuru na ụlọụka ‘’Diocese of Tyler’’ ga-ano n’okpuruochịchị Bishọpụ Joe Vesquez nke Austin nwa obere oge.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *