Take a fresh look at your lifestyle.

Naijiria na Saudi Arabia abanyela aka n’akwụkwọ nkwekọrịta.

chigo deziri ya n'Igbo.

0 207

Naijiria na Saudi bịanyere aka n’akwụkwọ nkwekọrịta maka mmekorita ike ọkụ.

Naijiria na Saudi Arabia abanyela aka n’akwụkwọ nkwekọrịta (MoU) iji kwalite mmekorita, mgbanwe ozi na nnyefe teknụzụ na mpaghara mmanụ. Ụlọ ọrụ Federal Ministry of Petroleum Resources ekwuputala nke a.

Onye minista na-ahụ maka akụ na ụba mmanụ (Oil), Senator Heineken Lokpobiri bịanyere aka na nnọchite anya gọọmentị etiti, ebe Minista Energy nke Saudi Arabia, Prince Abdulaziz bin Salman, bịanyere aka na mba ya.

“Ebumnobi bụ isi nke MoU bụ ịkwalite mmekorita, mgbanwe ozi na ịnyefe teknụzụ, si otú a na-ekepụta gburugburu ebe obibi dị mma maka mmekọrịta bara uru.

“Otu n’ime uru ndị bụ isi a na-atụ anya na nkwekọrịta dị ịrịba ama a bụ ikwado mgbanwe teknụzụ. Ebe Saudi Arabia na-anya isi teknụzụ dị elu na nyocha na mmepụta mmanụ na gas, Naijiria ga-enweta nke ọma site na nnyefe ihe ọmụma a.

Ọ gara n’ihu kwupụta na nkwekọrịta ahụ ga-adọta nnukwu ego ntinye aka na mba ofesi na mpaghara mmanụ na gas na Nigeria.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *