Take a fresh look at your lifestyle.

Steeti Anambra :Maazị Jude Nwankwo, agwala ndị ọrụ ugbo ka ha malite iweta ihe ubi.

chigo.

0 339

Onye njikwa mmemme, ọrụ ugbo nke ,Steeti Anambra , Maazị Jude Nwankwo, agwala ndị ọrụ ugbo ka ha malite iweta ihe ubi ha iji gbochie idei mmiri na-abịanụ na steeti Anambra, .

Nwankwo nyere ndụmọdụ na Awka na Thursday mgbe ọ na-agwa News Agency of Nigeria, NAN okwu.

Ọ kọwara na nke a abụrụla ihe dị mkpa iji gbochie nnukwu mmefu  ide mmiri ga-akpata.

“Tupu oge ịkọ ihe, anyị kụziiri ndị ọrụ ugbo, ọkachasị ndị dị nso n’akụkụ osimiri, ka ha na-akọ ihe n’oge ka ha wee na-ewe ihe ubi n’oge tupu oge idei mmiri.

“N’agbanyeghị na nsogbu ahụ ka na-amalite, ndụmọdụ anyị nyere ndị ọrụ ugbo bụ ka ha malite iwe ihe ubi ugbu a iji gbochie nnukwu mfu metụtara oke idei mmiri,” ka o kwuru.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *