Take a fresh look at your lifestyle.

Israel-Gaza crisis: Dika Blinken wuchiri Israel, lee ihe ise Ọhụrụ merela

0 273

Dịka odeakwụkwọ ukwu mba Amerịka wuchiri Tel Aviv, Izrel ka ọ gachara ụfọdụ mba ndị Arab maka ịkpa maka ọkwu metụtara ọgụ Izrel na Palestine, mmadụ otu nde (1million) ndị Palestine agbaala ọsọdụ gbapụ na mpaghara Ugwu Gaza, dịka otu UN si kwuo.

Ndịagha Izrel kwuru na ndị agha nnụpụisi Hamas jichiri mmadụ 199- nke a pụtara na ọnụọgụgụ ndị Hamas tọọrọ esila na 44 ọ bụ ụnyahụ rịa elu.

Praim Minsta mba Izrel bụ Netanyahu na otu Hamas agọọla na ọ bụghị eziokwu na ha nwere nkwekọrịta inye ohere ka ihe enyemaka bata site n’okeala Rafah dị n’agbata ha na mba Ijipt.

A ka gbachiri okeala Rafah na-agbanyeghị na igwe mmadụ gbakọrọ n’ọnụụzọ ama ya, na-agbanyeghị mkpu a na-eti ka e nwee ohere ibubata nri, ọgwụ na mmanụ ụgbọala na Gaza.

Cheta na Izrel gbachiri okeala jụ na nri,ọkụ mmanụụgbọala na mmand agaghị apụ maọbụ bata Gaza dịka ha na-abọ mwakpo otu Hamas wakporo Ndịda Anyanwụ Izrel n’ụbọchị Satode, abalị asaa nke ọnwa Oktoba afọ 2023.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *