Take a fresh look at your lifestyle.

Nema amaala ọkwa maka ideimmiri ga-eme na steeti dị icheiche

0 245

Ngalaba ‘National Emergency Management Agency’ (Nema) amaala ọkwa maka ideimmiri ga-amalite na steeti dị icheiche na Naịjirịa dịka mba Cameroon mepere ọdọ mmiri ha bụ ‘Lagdo Dam’.

Onyeisi Nema bụ Mustapha Ahmed dọrọ aka na ntị a dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n’Abuja n’ụbọchị Satọde, ma kwuo na ụfọdụ steeti dịka Adamawa, Taraba na Benue amalitela ịhụ ideimmiri na mpaghara ha dị icheiche.

Ọ kpọrọ oku ka styeeti ndị dị n’akụkọ osimiri Niger na osimiri Benue malite atụmatụ gbatagbata ha na-egbughị oge maka na ha ga-ahụ ideimmiri n’ụbọchị olemole na-abịanụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *