Take a fresh look at your lifestyle.

Ọtụtụ puku mmadụ anwụọla dịka oke ifufe butere oke idemmiri na mba Libya.

chigo.

0 507

Ọtụtụ puku mmadụ anwụọla dịka oke ifufe butere oke idemmiri na mba Libya.

Onyeisi mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Libya nke mbaụwa akwadoghi kwuru na ọnụọgụgụ ndị nwụrụla akarịala puku abụọ ebe a na-achọ ọtụtụ achọ.

Onye ọrụ pụrụiche na Libya bụ Jalel Harchaoui gwara BBC na ndị nwụrụ nwereike iru “ọtụtụ puku” mmadụ.

Oke ifufe a kpọro ‘Storm Daniels’ dakwasịrị mba ahụ n’ụbọchị Sọnde nke mere e jiri tinye ọnọdụ gbata gbata.

Ndịagha mba Libya mmadụ asaa na-efu efu oge ha na-agba mbọ ịzụpụta ndị mmadụ.

Obodo ndị idemmiri metụtara gụnyere Benghazi, Sousse, Derna na Al-Marj.

Ndị ọrụ Red Cross na Libya kwuru na ihe ruru ụlọ otu narị na iri ise (150) emebiela n’idemmiri ahụ.

Ha kwuru ọdọmmiri ‘dam’ abụọ dị na Derna ebe mmadụ ruru 100,000 bi mebiri ebe mmiri dị na ya riri ọtụtụ ụlọ na ndị mmadụ bi ebe ahụ.

Onye ọrụ gọọmentị na Derna kwuru na a hụla ozu mmadụ karịrị otu puku (1000).

Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Hichem Chkiouat kwuru na “ozu ndị mmadụ tọgbọ ebe niile.”

bbc

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *