Take a fresh look at your lifestyle.

Onye isi ala Naijiria kpọrọ oku maka nnapụta ọchịchị onye kwuo uche ya na Afrika.

Temitope Mustapha, Abuja

0 208

Onye isi ala Naijiria kpọrọ oku maka nnapụta ọchịchị onye kwuo uche ya na Afrika.

Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu akpọọla oku ka a napụta ọchịchị onye kwuo uche ya n’Afrịka na-ekwu na ike ime nke a  dị n’aka ndị Afrịka ọ bụghị n’ọgụ egbe.

Onye isi ala  kwukwara na a gaghị ekwe ka nke laa n’iyi n’Africa  site na esemokwu ntuli aka.

Onye ndụmọdụ pụrụiche nye Onye isi ala na  na mgbasa ozi, Ajuri Ngelale mere ka a mara nke a na Wednesde mgbe ọ na-akọwara ndị nta akụkọ State House maka  ọchịchị ndị agha  wakporo mba Gabon.

Dị ka Ngelale si kwuo, Onye isi ala Naijiria na-ele anya maka nkwụsi ike  nke ọchịchị    onye kwuo uche ya” na mba AFIRIKA,nke a chọrọ n’ usoro udo na abụghị n’usoro tigbuo zogbuo.

Ngelale kwuru na “Onye isi ala dịka nwoke nke chụpụrụ ihe dị ukwuu nke onwe ya na ndụ ya, n’ịkwalite na ịgbachitere ọchịchị onye kwuo uche ya bụ nkwenye na-enweghị mgbagha na ike dị n’aka ndị ukwu Africa na ọ bụghị n’ime gbọmgbọm nke ọchịchị onye kwuo uche ya. egbe ejuru ibu.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *