Take a fresh look at your lifestyle.

Putin gwara Prime Minista India Modi na ọ gaghị aga nzukọ G20.

chigo dere ya n'igbo.

0 256

Putin gwara Prime Minista India Modi na ọ gaghị aga nzukọ G20.

Onye isi ala Rọshịa bụ Vladimir Putin agwala Prime Minista India Narendra Modi n’ekwentị na ọ gaghị aga nzukọ G20.

India na-akwado nzukọ ọgbakọ nke afọ a, nke a ga-eme na isi obodo Delhi site na Septemba 9 ruo 10.

Putin gwara Modi na Mịnịsta na-ahụ maka mba ofesi  na  Russia bụ Sergei Lavrov ga-aga nzukọ a n’aha ya.

Ndị isi abụọ a tụlekwara ọtụtụ “okwu  gbasar mpaghara ahụ na nke zuru ụwa ọnụ.

Onye na-ekwuchitere gọọmentị Rọshịa kwuru n’izu gara aga na Mr. Putin agaghị aga nzukọ a n’ihi na o nwere “usoro ọrụ oji  n’aka.”

G20 gụnyere mba 19 kasị baa ọgaranya n’ụwa yana European Union. India na-ejide ugbu a onye isi oche G20, nke na-agbanwe kwa afọ n’etiti ndị otu a.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *