Putin gwara Prime Minista India Modi na ọ gaghị aga nzukọ G20.
Onye isi ala Rọshịa bụ Vladimir Putin agwala Prime Minista India Narendra Modi n’ekwentị na ọ gaghị aga nzukọ G20.
India na-akwado nzukọ ọgbakọ nke afọ a, nke a ga-eme na isi obodo Delhi site na Septemba 9 ruo 10.
Putin gwara Modi na Mịnịsta na-ahụ maka mba ofesi na Russia bụ Sergei Lavrov ga-aga nzukọ a n’aha ya.
Ndị isi abụọ a tụlekwara ọtụtụ “okwu gbasar mpaghara ahụ na nke zuru ụwa ọnụ.
Onye na-ekwuchitere gọọmentị Rọshịa kwuru n’izu gara aga na Mr. Putin agaghị aga nzukọ a n’ihi na o nwere “usoro ọrụ oji n’aka.”
G20 gụnyere mba 19 kasị baa ọgaranya n’ụwa yana European Union. India na-ejide ugbu a onye isi oche G20, nke na-agbanwe kwa afọ n’etiti ndị otu a.
Leave a Reply