Take a fresh look at your lifestyle.

Lee ebubo ọhụrụ a ga-eji kpụpụ Donald Trump ụlọikpe na steeti Georgia

0 402

Aka chịburu mba Amerịka bụ Donald Trump nwere ebubo iri na atop ọhụrụ chere ya n’ihu na steeti Georgia, dịka ndị ọkaiwu kwuru na ọ kpara nkata ịkagbu mpụtara ntuliaka onyeisiala nke afọ 2020.

N’akwụkwọ ebubo ahụ nke pụtara ihe n’ụbọchị Mọnde bụ ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Ọgọst, a boro Trump na mmadụ 18 ndị ọzọ ebubo dị icheiche nke gụnyere isonye n’otu ndị omekome, ibo ebubo ụgha na e nwere nrụrụaka na ntuliaka, na ndị ọzọ.

Otu n’ime ndị aha ha dị n’ebubo ọhụrụ a bụ Rudy Giuliani onye bụbu ọkaiwu Trump n’oge gara aga.

Mana Trump kwuru na ebubo niile ndị a bụ ụgha ma bụrụkwa atụmatụ ibuso ya agha iji gbochie ndọrọndọrọ ọchịchị ọ na-azọ.

Nke a bụ ebubo nke anọ a na-ebo Donald Trump n’ime ọnwa anọ. Trump bụkwa onyeisiala Amerịka mbụ a na-akpụpụ ụlọikpe dịka ọ rituchara n’ọchịchị.

Ọkaiwu Fani Willis bụ onye malitere nnyocha maka ebubo ndị a kwuru na Trump na mmadụ iri na asato ndị e boro ebubo ndị a nwere ruo ụbọchị iri abuo na ise nke ọnwa Ọgọst iji nyefee onwe ha n’aka ndị ọrụ nchekwa.

Lee ụfọdụ ebubo ọhụrụ a na-ebo Donald Trump:

  • Ịkpa nkata iji ụzọ aghụghọ gbanwee mpụtara ntuliaka
  • Ịkpọ odeakwụkwọ steeti Georgia bụ Brad Raffensperger n’ekwentị ma gwa ya ka ọ gbanwee mpụtara ntuliaka n’ụzọ iwu akwadoghị.
  • Ịkpa nkata ịkpọta ndị ọrụ ntuliaka adịgboroja iji were ha gbanwee mpụtara ntuliaka na Georgia.
  • Ịkụ akwụkwọ ozi adịgboroja iji kwanye ndị omeiwu steeti Georgia ka ha jụ ịnabata ụfọdụ vootu a tụrụ na ntuliaka

Na ndị ọzọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *