Take a fresh look at your lifestyle.

Etu ejije ‘prank’ si tinye ndị ntorobịa atọ na nsogbu n’Enugwu

0 367

Ndị uweojii Enugwu Steeti ejichiela ndị ntorobịa atọ maka ime ejije soshal midia gosiri ebe a na-eti otu nwa agbọghọ ihe, yipu ya uwe ya ma kpụchaa ya isi.

Aha ndị ntorobịa a bụ Obed Chekwube Ugwuanyi, onye e ji MC Sharp mara; Chinenye Agbo onye e ji Star Ella Ada mara; na Anastasia Onu.

Daniel Ndukwe bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu kwuru na ha jidere mmadụ atọ a n’abali iri na ano nke ọnwa Ọgọst maka ihe onyonyo ahụ ha mere, mana ha kwuru na ọ bụ onyonyo eji akpa eguregwu nke bekee na-akpọ ‘prank’.

“Ha sị na ha mere onyonyo ahụ iji nweta ọtụtụ ndị mmadụ ka ha na-eso akara soshal midia ha,” Ndukwe kwuru.

Mana o kwuru na onyeisi ndị uweojii bụ Ahmed Ammani katọrọ ya bụ ihe ma nye iwu ka ndị uweojii nyochaa ya nke ọma ma kpụpụ ndị ntorobịa atọ ahụ ụlọikpe ma a chọpụta na ha dara iwu, iji dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha wepụ aka n’ụdị ihe a nke nwereike ibute ọgbaaghara n’obodo.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *