Take a fresh look at your lifestyle.

Mgbọ ogbunigwe nke Russia dara n’otu ụlọ oriri na ọṅụṅụ na obodo Ukraine n’ime Zaporizhzhia

Lantana Nasir dere ya na bekee.

0 350

Mgbọ ogbunigwe nke Russia dara n’otu ụlọ oriri na ọṅụṅụ na obodo Ukraine n’ime Zaporizhzhia na mgbede Thursday. Otu onye nwụrụ mmadu  16 merụrụ ahụ, ndị ọrụ Ukraine kwuru.

Ndị uwe ojii mba ahụ  kwuru na ogbunigwe Iskander kụrụ obodo ahụ na elekere 7:20 nke abalị. (1620 GMT).

“Zaporizhzhia bụ mpaghara  na-ata ahụhụ kwa ụbọchị site na mgbọ ndị Russia. Ọkụ gbara n’otu ụlọ ndị nkịtị”Onye isi ala Ukraine Volodymyr Zelenskiy kwuru.

Gọvanọ Zaporizhzhia Yuriy Malashko kwuru na mmadụ iri na isii  merụrụ ahụ gụnyere ụmụaka anọ.

Ndị mgbasa ozi mpaghara kwuru na ụlọ ahụ mebiri emebi bụ Reikartz Hotel dị n’etiti obodo dị n’akụkụ osimiri Dnipro.

Ndị ọrụ United Nations na-eji ụlọ oriri na ọṅụṅụ ahụ mgbe ha na-arụ ọrụ n’ime obodo ahụ, Denise Brown, Onye Nchịkọba Ọrụ Ndị Mmadụ na Ukraine, kwuru na nkwupụta email.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *