Take a fresh look at your lifestyle.

A tụọla Tory Lanez nga afọ iri maka ịgba Megan Thee Stallion egbe

0 269

A tụọla onye oti egwu mba Canada a ma ama bụ Tory Lanez nga afọ iri maka ịgba ogbo ya bụ Megan Thee Stallion egbe.

Lanez gbara Megan Thee Stallion egbe n’ụkwụ mgbe ha na-arụrịtaụka ebe ha gara ịkụ nkwọrị n’afọ 2020.

Ikpe maara ya n’ebubo ọnụ atọ metụtara ibu egbe n’ọnwa Disemba ebe ọ nọ na nga kamgbe ahụ.

Egbe ọ gbara ya butere ọgbaghara na ịda mba n’etiti ndị niile na-eti egwu na mba ofesi dịka a wara ya Thee Stallion ụkwụ iji wepụta mgbọ egbe ahụ.

Ọkaikpe nke mpaghara ahụ na ngwụcha ikpe ahụ kwuru na mgbapụta ihe ya mere ka eleba anya n’ihe banyere mwakpo a na-eme ụmụnwaanyị.

A gbara egbe ahụ dịka ha na-ala site n’emume ikpori ndụ n’akụkụ ọdọmmiri ‘swimming pool’ nke onye a ma ama bụ Kylie Jenner haziri.

Ndị ọkaiwu gwara ọkaikpe ka a tụọ Lanez nga ruru afọ iri na atọ. Ha kwuru na e kwesịrị ịtụ ya nga ogologo oge maka ịgba onye na o nweghi ihe o mere ya egbe n’ebe obibi ndị mmadụ dị jụụ nakwa ime mkpesa iji mechuo ya ihu dịka ọ gbachara ya egbe a.

Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndị ihe metụtara na Los Angeles bụ Tanishia Wright gwara ndị ntaakụkọ na ‘mwakpo megide ụmụnwaanyị isi ojii bụ nsogbu zuru ụwa ọnụ a na-anaghị elebaara anya dịka o kwesịrị.”

Ezigbo aha Lanez bụ Daystar Perterson, o tiela ọtụtụ ewere egwu wuru ewu na mba Amerịka n’ime afọ asaa gara aga.

Megan onye ezigbo aha ya bụ Megan Pete, gwara ụlọikpe na ya nwamadị a nwere esemokwu maka mmekọrịta ha nwere n’oge gara aga nke mere ha abụọ jiri na-akọ ibe ya ọnụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *