Take a fresh look at your lifestyle.

Onye isi ala Tinubu kelere onye ọchụnta ego n’ihu Abdul Rabiu ka ọ gbara afọ 63.

Mercy Chukwudiebere dere ya na bekee.

0 340

Onye isi ala Tinubu kelere onye ọchụnta ego n’ihu Abdul Rabiu ka ọ gbara afọ 63.

Onye isi ala Naijiria bụ Bola Tinubu ezipụla ozi obi ọma ya nyee  onye ọchụnta ego  na onye ọrụ ebere, Alhaji Abdul Rabiu, onye guzobere BUA Group na Abdul Samad Rabiu Africa Initiative (ASR Africa) na emume ncheta ọmụmụ  ya.

Onye isi ala Tinubu toro amamihe achụmnta ego a bụ nke onye ama ama na okwukwe ya na Naijiria.

Ọ gara n’ihu kwupụta nnukwu ego nke otu onye nwe BUA Group mebere n’akụkụ akụ na ụba dị okemkpa nke o jiri kee ọtụtụ puku ndị Naijiria ọrụ.

Onye ndu Naijiria jiri ohere nke ụbọchị ọmụmụ nke ndị ọrụ mmepụta ihe na-etokwa Alhaji Samad maka oke ọrụ ebere ya na agụmakwụkwọ, mmepe mmekọrịta mmadụ na ahụike. Mgbalị niile a jikọtara ọnụ agbanweela ndụ nke ọma, ọ bụghị naanị na Nigeria kamakwa n’ofe Africa.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *