Take a fresh look at your lifestyle.

Osote onyeisi ụlọ omebe iwu Sineti na-ekele onye isi oche APC .

Edwin Akwueh, Abuja dere ya na bekee,

0 444

Osote onyeisi ụlọ omebe iwu Sineti na-ekele onye isi oche APC .

 

Osote onyeisi ụlọ omebe iwu ndị omebe iwu Naijiria bụ Sinetọ Barau Jibrin, etoola mpụta onye bụbu aka na-achị Kano steeti, Dr. Abdullahi Umar Ganduje dị ka onyeisi oche otu All Progressives Congress, APC.

Sinetọ Barau, na nkwupụta nke onye ndụmọdụ ya pụrụ iche na mgbasa ozi , Ismail Mudashir, kwuru na ya na onye bụbu Gọvanọ nọ n’isi ọchịchị nke APC, a ga-emegharị otu ọchịchị na-achị ma wusie ike maka ọdịmma ndị òtù ya niile.

A ga-echeta na, a họpụtara Ganduje ka ọ bụrụ onyeisi oche nke mba na ọgbakọ nke iri na abụọ nke National Executive Committee, NEC nzukọ nke APC mere na Transcorp Hilton dị n’Abuja na Tọzdee.

O kwuru na site n’ahụmahụ dị ukwuu nke onye bụbu Gọvanọ Kano Steeti, na a ga-akwalite usoro ngbochi esemokwu nke APC iji belata esemokwu n’ime ya.

Sinetọ Barau kelekwara onye bụbu ọnụ na-ekwuchitere Sineti, Ajibola Basiru, onye si Osun Steeti bụ onye pụtara dịka odeakwụkwọ mba ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *