Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmentị Enugwu ịkpọchị ụlọahịa ndị mmadụ n’ihi ‘sit-at-home’ megidere ikike.

chigo.

0 271

Ọkaiwu Felix Jonathan, onye ji ọkwa odeakwụkwọ nke otu jikọrọ ndị ọkaiwu Igbo n’Abuja, kwuru na Gọvanọ Peter Mba enweghị ikike ọbụla ịmanye onye ọbụla ka o mepee ụlọahịa ya maọbụ mechie ya ụbọchị ọbụla masịrị ya.

Felix kwuru na ndị ahụ kwesịrị ịbịakọta ọnụ gbaa gọọmentị Enugwu Steeti akwụkwọ n’ụlọ omeiwu ukwu gọọmentị etiti.

“Ọ bụrụ na ha gaa n’ụlọikpe steeti, ha nwereike ha agaghị enweta ikpe ziri ezi n’ihi na ụlọikpe steeti niile dị n’okpuru gọvanọ, mana ha gaa n’ụlọikpe gọọmentị etiti, ọkaikpe ma ihe ọ na-eme ga-enye iwu ka gọọmentị hapụ ndị niile ha mechiri ụlọahịa ha, maka na onweghị ikike ọbụla ime ihe dị etu ahụ,” Ọkaiwu Felix Jonathan kwuru.

bbc igbo

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *