Take a fresh look at your lifestyle.

Etu ndị agboro na-anakọ ego ụtụisi si akpa ike n’akụkụ Naijirịa

0 332

N’akụkụ Naịjirịa dị iche iche ụfọdụ ezinụlọ nwere agba na-ewe ndị mmadụ dịka otu nwoke kpọrọ onwe ya Kaptịn Nwokuha n’ọrụ maka atụmatụ nnakọ ego ụtụ isi n’aka ọha.

Maazị Nwokuha na-ebu agba agba osisi akparịgharị n’okporoụzọ Port Harcourt, Rịvas steeti ji gosi ike ya dịka dimkpa.

Ọrụ nwoke a gbara afọ iri ato na ano bụ ịnakọ ndị ọkwọ ụgbọala bọosụ nakwa ndị na-ebu ndị na-eme njem ego ụtụisi.

Ọrụ a dị etu bụ ihe gbara afọ n’usoro ochie Naịjirịa mgbe ndị oji ego achọ ego na-akwụ ndị isi obodo ụgwọ maọbụ zitere ha onyinye iji nata ikike ịrụ ọrụ n’obodo mana ugbua ya bụ ihe aghọọla omenala nke ndị mmadụ na-akatọ dịka ‘ịna ego n’ike’.

Ndị ọkwọ ụgbọala na-akwụ ndị agboro ihe ruru pasentị iri abuo ego ha ụgwọ njem ndị mmadụ na-enye ha.

A na-akwụpụ ugegbe ụgbọala maka akwụkwọ akara njirimara ụgbọala ụgbọala na-ekwekweghi kwụọ ụgwụ ndị a, onye ju ndị dịka Maazị Nwokuha ewere agba agba osisi kupuo ya isi.

Maazị Nwokuha onye ji nwunye na ụmụ abụọ kwuru na ọ na-anakọ ihe dịka N5000 ruo N7000 kwa ụbọchị.

Ọ kọwara na ọ ne-eji ụfọdụ ego ahụ machie akpa ebe ezinaụlọ ise na mpaghara na-ekesa ya bụ ego.

Ndị ọchịchị gọọmentị na steeti nakwa n’okpuruọchịchị dị iche iche n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche na-esi n’aka ndị agboro a anakọ ego ụtụ isi.

Michael Ango bụbu onye ọrụ ụtụ isi gọomentị kwuru “Ndị a na-etinye ego ndị n’ọbaego nke ha, nwere oke nke ha n’ime ego ụtụ isi a tupu ha enye gọọmentị oke nke ya”.

Mana gọọmentị Onyeisiala Bola Tinubu aṅụọla iyi ibuso ndị agboro “, ndị ohi ndị were onwe ha n’ọrụ” agha.

Ọrụ a Maazị Nwokuha na-arụ bụ ọrụ ndị ọchịchị okpuruọchịchị kwesịrị ị na-arụ. Naịjirịa nwere okpuruọchịchị 780 mana ha anaghị arụọrụ ha.

Ọtụtụ ndị dịka Nwokuha na-eji ihe e ji egbochi ụgbọala ịgba n’ụzọ gbochi ndị njem ụgbọala ịgba ruo mgbe ha nyere ha ego ngafe.

Otu onye na-agba nnukwu ụgbọala gwongworo gwara ndi ntaakuko na ọ na-akwụ ndị a ihe ruru N80,000 site na njem ya ibu bu si Legọs gaa Imo steeti.

O dobeghi anya etu gọọmentị etiti ga-esi kwụsị ihe a mana ọ ga-abụ ihe ọrụ ya na steeti na okpuruọchịchị ga-ejịkọ aka ọnụ rụọ.

Onyeisiala Tinubu kwuru na ọ chọrọ igbanwe usoro ọrụ ịnakọ ego ụtụisi iji kwalite akụnụba Naịjirịa.

Ndekọ gọọmentị na-egosi na ego ụtụisi Naịjirịa na-ana nọ na pasentị iri na otu na afo 2021, nke dị ala karịa ihe ọtụ ụlọakụ ụwa ‘World Bank’ depụtara maka mba Kenya (13%) na South Africa (26%).

Ka ọ dị ugbua, gọọmentịTinubu na-elekwasị anya na ụtụ isi na-ada n’elu ọnụahịanke a na-akpọ ‘Value-Added Tax (VAT)’.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *