Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe isi ike emeela ka anyị kagbuo atụmatụ ịmụ oke ụmụ – Ndị ntorobịa

0 251

Ọtụtụ ndị ntorobịa Naịjirịa na-ekwu na ha achọghị ịmụ ụmụ karịa abụọ maọbụ atọ n’ihi etu ihe si sie ike na Naịjirịa ugbua.

Nke a bụ nchọpụta  ndi nta akuko mere dịka anyị gbara ndị ntorobịa olemole ajụjụọnụ gbasara ụmụ ole ha ga-achọ ịmụ, dịka ụbọchị 11 nke ọnwa Julaị afọ ọbụla bụ ụbọchị otu ‘United Nations’ wepụtara dịka ‘World Population Day’.

Ngụkọ ndị UN gosiri na a na-atụ anya na Naịjirịa ga-abụ mba nke atọ ọnụọgụgụ ndị bi n’ime ya kacha n’ụwa niile n’ebe afọ 2050.

Ka ọ dị ugbua, nchịkọta ọnụọgụgụ ndị bi na Naijirịa ruru nde 225.

Ngụkọ gosiri na mmadụ nde 107 bi na Naịjirịa nọ n’agbata otu afọ ruo afọ 17, ebe nde 59 bụ ndị nọ n’agbata afọ 18 ruo afọ 35.

Nke a gosiri na ọ bụ ndị ntorobịa na ụmụaka bụ ndị kacha n’ọnụọgụgụ na Naịjirịa ugbua.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *