Take a fresh look at your lifestyle.

Gọvanọ Adeleke gbalahụrụ atụmatụ ndị chọrọ igbu ya – Gọọmentị Osun

0 300

Gọvanọ Osun steeti bụ Ademola Adeleke agwaala ọha ka ha nọrọ jụụ dịka ọgbaghara dapụtacjhara n’akụkụ Osogbo nke steeti ahụ bụ ebe ọ gara sonye emume ekpere maka emume ụka alakụba nke Eid-El-Kabir.

Ụfọdụ ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ka obere ọgbaghara malitere ịda n’ama ekpere ahụ mana o dochaghi anya ihe nọ na-eme ebe ahụ.

Ọtụtụ kepukepu dapụtara ka akụkọ a malitere ifesa mana ozi si n’aka gọọmentị steeti ahụ kwuru na ihe ahụ mere ebe ahụ bụ ‘atụmatụ ndị nwara igbu gọvanọ” steeti ahụ.

Ozi ha kwuru na gọvanọ Ademola Adeleke na-arịọ ọha ka ha nọrọ jụụ “dịka ọ gbalahụrụ atụmatụ ndị chọrọ igbu ya n’ime ama ekpere Eid nke Osogbo.”

N’ozi a nke ọnụ na-ekwuru Adeleke bụ Olawale Rasheed zipụtara, o kelere Chukwu maka etu o si zọọ ndụ gọvanọ ahụ na ndị otu ya ma nye ndị ọrụ nchekwa iwu ka a nwụchịe ndị nọ n’isi atụmatụ ahụ.

Ozi a bokwara ebubo ma rụọ pati All Progressives Congress, APC aka dịka ọ kpọrọ ihe a mere “nkata akpara akpa iji wakpoo gọvanọ na’ama ekpere nke si n’aka ndị APC”.

Ozi a gakwara n’ihu rụọ sịnetọ Ajibola Bashiru aka dịka o kwuru na ọ bịara nọchịe ebe gọvanọ kwesịrị ịnọ ma jụ ịpụ ebe ahụ agbanyeghi na a rịrọrọ ya ugboro ugboro.

A gara n’ihu kọwa na ụfọdụ ndị pati PDP nwara ịgbachitere gọvanọ natara iti ihe nke mere ya bụ ọgbaghara jiri dapụta.

Gọọmentị steeti kọwara na ndị agbaro bucha ngwa ọgụ wụbatara n’ihe ama ekpere ahụ ma gbaa ama na ozi si n’aka ndị ọrụ nchekwa kọwara na ndị ahụ bịara igbu gọvanọ ahụ.

Ọtụtụ ihe onyonyo pụtara ebe gọvanọ ahụ na-agbapụ ama ekpere ahụ.

Otu APC nke nọ na Osun arụọla gọvanọ Ademola Adeleke na ndị ha kpọrọ ‘ndị agboro” na-akwado otu PDP aka ma na-ekwu na ha bụ ndị agboro na ndị ọrụ nchekwa wụbata ama ekpere nke Okebale Osogbo.

Dịka onyeisi oche APC bụ Sooko Tajudeen Lawal siri kwuo, ọ kọwara na n’ime ozi onye ọrụ mgbasaozi ha bụ Kola Olabisi zipụtara na gọvanọ ahụ na ndị ọrụ ya wụbatara ama ekpere ahụ gwaa otu onyeisi obodo ahụ bụ Tunde Badmus nakwa sịnetọ Ajibola Bashiru ka ha bilie ebe ha nọ ma chọọ ebe ọzọ tukwuru.

Ha boro ebubo na e ji aka ike chọrọ ịkwapụ Badmus na Sịnetọ Bashiru ebe ha nọ n’ama ekpere ahụ ma kwukwa na gọvanọ nyere iwu ka a nwụchịe ha abụọ.

Ha gara n’ihu kwuo na okwu isi na a nwara igbu gọvanọ bụ “okwu na achịtaghị aja” maka kwuo na nke a bụ n’ihi gọvanọ apụtaghị ma ncha n’ụgbọala ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *