Take a fresh look at your lifestyle.

Atụmatụ ibuga ndị na-agba ọsọ ndụ Rwanda megidere iwu- Ụlọikpe Briten

0 262

Ụlọikpe mba Briten ekpebiela na atụmatụ gọọmentị mba ahụ ibuga ndị na-agba ọsọ ndụ gbatara mba ahụ mba Rwanda megidere iwu.

Ọkaikpe Lord Burnett bụ onye kwupụtara mkpebi Ụlọikpe Mkpegharị mba ahụ mere ụbọchị Tozde sịrị na, “Mkpebi nke ndịisi Ụlọikpe na-ekwu na usoro nhazi mbịarambịara Rwanda etozughị etozu nke mere na ụfọdụ ndị na-agba ọsọ ndụ e ziga ha Rwanda nwere ikpe akpọghachiha mba ha bụ ebe e nwere ikpe ịkpagbu ha.”

Otu na-agba mbọ maka ikike ndị na-agba ọsọ ndụ a kpọrọ ‘Asylum Aid’ etoola mkpebi Ụlọikpe Mkpegharị Briten sị na “O gosiri mkpa iso usoro iwu nakwa ime onye ka e mere ibe ya n’ebe okwu ikike dịịrị onye dị.”

Mana Praim Minista Briten bụ Rishi Sunak kwuru na ya ekwetaghị na mkpebi ahụ, na ha ga- agbbagha n’ụlọikpe.

Cheta na Gọọmentị Briten wepụtara atụmatụ iziga ndị na-agba ọsọ ndụ gbatara Briten mba Rwanda dị n’Ọwụị̀a Anyanwụ Afrika bụ ebe ha ga-anọ enyocha ma ihe na-eyi ndụ egwu ọ na-achụ ha n’ezie tupu a nabata ha mba Briten maọbụ zichighaa ha mba ha si.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *