Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe mere Buhari ejighi aka ya wepụ ‘subsidy’ mmanụ ụgbọala – Garba Shehu

0 228

Garba Shehu bụbu ọnụ na-ekwuru Muhammadu Buhari bụbu Onyeisiala Naịjirịa akọwaala ihe mere ha jiri aghara iwepụ ego enyemaka mmanụ ụgbọala bụ ‘subsidy’.

Shehu kwuru nke a n’ime otu ọnwa Buhari nyefere Bola Tinubu ọchịchị onyeisiala sị na ha mere iji chere oge kachasị mma.

“Anyị hazichara atụmatụ iwepu ego enyemaka mmanụ ụgbọala ma dosa ya maka oge kachasị mma iji wepụ ya.

“Ọ dịghị mma iwepụ ya n’oge obi kooro onye ọbụla n’elu na Naịjirịa, o nweghi onye ndu uche ya zuruoke ga-akwanye nkụ n’ọkụ na-enwu enwu.”

Mgbe a jụrụ ya ihe mere Onyeisiala Tinubu jiri wepụ ya n’otu ntabi anya ọ bara ọchịchị, Shehu na ọ naanị ọchịchị banyere ọhụrụ nwereike ime nke a.

“Ịgwa gị eziokwu Buhari agaghị eme ụfọdụ mkpebi ga-amaja obodo na ngwụcha ọchịchi ya maka na APC chọrọ imeri na ntuliaka.”

O kwuru na a gaara achụpụ pati nọ n’ọchịchị n’ọkwa ma ọ bụrụ na ha mere mkpebi banyere mwepu ‘subsidy’ mmanụ ụgbọala.

“Ugbua ntuliaka gachara ma e nwee onye ndu aka siri ike nwereike idu obodo gaa n’ihu. Obi siri anyị ike na ọ ga-eme mkpebi ndị a siri ike banyere akunaụba.

Shehu gara n’ihu kwuo na ọ bụ eziokwu na Buhari ewepughi ego enyemaka mmanụ ụgbọala kama na o nwere ego enyemaka ndị ọzọ o wepụrụ.

Ndị a gụnyere; ‘subsidy ọkụ latrik’, nke fatịlaịza, nke ndị njem ala nsọ, nke mmanụ dịzụlụ nakwa nke kerozin.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *