Take a fresh look at your lifestyle.

Maada Bio emeriela ntuliaka onyeisiala mba Sierra Leone nke ugboro abụọ

0 344

Onyeisiala mba Sierra Leone bụ Julius Maada Bio enwetala mmeri na ntuliaka ọkwa onyeisiala mba ahụ bụ nke e mere n’ụbọchị Satọde, Jun 24, 2023.

Ụlọọrụ nhazi ntuliaka bụ ‘Electoral Commission of Sierra Leone’ kpọpụtara na Bio nke ‘Sierra Leone Peoples Party (SLPP) nwetara vootu 1,566,932, nke bụ pasentị 56 na ụma nke vootu niile a tụrụ na ntuliaka ahụ.

Onye gbara onye nke abụọ bụ Samura Kamara nke ‘All Peoples Congress’ (APC) nwetara vootu 1,148,262 nke bụ pasentị 41 na ụma nke vootu niile a tụrụ.

Dịka iwu si dị, mmadụ ga-enwetarịrị vootu gafere pasentị 55 iji bụrụ onyeisiala, ma ọ bụghị ya a ga-enwe agba nke abụọ nke ntuliaka ahụ.

Mana nke a na-abịa dịka ndị otu nlekọta ntuliaka dị icheiche nke gụnyere ndị ‘European Union’ nakwa ‘Commonwealth’ kwuru na ntuliaka ahụ nwere ụfọdụ nrụrụaka, ma bụrụkwa nke ọgbaghara dị icheiche dị na ya.

Ndị APC boro ebubo na ndị ọrụ nchekwa gbara egbe n’ogige isi ụlọọrụ ha oge Mazi Kamara na-agwa ndị ntaakụkọ okwu ebe ahụ n’ụbọchị Sọnde.

Kamara bokwara ebubo na e nwere izu ohi vootu nakwa ịkpachị ndị mmadụ ịtụ vootu na mpaghara ụfọdụ.

Mana ụlọọrụ ECSL kwuru na ha tinyere atụmatụ dị icheiche iji gbochie nrụrụaka na ntuliaka ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *