Take a fresh look at your lifestyle.

Mmadụ ise n’ime ndị Naịjirịa gara ekpere Hajj na mba Saudi Arabia alaala mmụọ

0 385

Ngalaba na-achịkọta njem ekpere nke ndị okpukperechi Islam na-aga na mba Saudi Arabia, a na-akpọ Hajj, ekwupụtala na mmadụ ise n’ime ụmụ Naịjirịa mere njem ahụ n’afọ a, anwụọla na Saudi Arabia.

Onyisi ngalaba ‘National Hajj Commission’ bke Baịjirịa bụ Usman Galadima, kwupụtara nke a n’ụbọchị Satọde n’ọgbakọ nke e nwere na Makkah, Saudi Arabia.

Galadima kwuru na n’ime mmadụ ise a, mmadụ abụọ si Osun Steeti, mmadụ abụọ si Kaduna Steeti, ebe otu onye si Plateau Steeti.

O kwukwara na mmadụ 30 n’ime ndị mere njem a ka a chọpụtara na ha nwere ọrịa isi mgbaka dị icheiche, mana ha na-ejikwa ndị ahụ n’ụlọọgwụ dịka ha nwere ndị dọkịta anọ bụ ọkachamara n’ahụike ụbụrụ.

Hajj bụ njem ekpere pụrụ iche nke ndị okpukperechi Islam na-eme kwa afọ n’ụlọ nsọ ukwu dị na Saudi Arabia.

Dịka okpukperechi Islam si dị, a tụrụ anya na ezigbo onye ‘muslim’ ga-emerịrị njem a ọbụladị otu ugboro na ndụ ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *