Take a fresh look at your lifestyle.

Pinnacle Oil Enugu: Ndị ojiegbe ọ gbara ụlọọrụ a ọkụ? Lee ihe anyị ma

0 516

Kepu kepu pụtara n’ekwu na ndị ojiegbe wakporo ụlọọrụ ebe a na-ere mmanụ ụgbọala a kpọrọ Pinnacle Oil dị na New Haven nke Enugwu Steeti n’abalị Tuzde 20 Juun, 2023.
Akụkọ a kwuru na ndị a ji egbe chusasịa ndị mmadụ na gburu gburu ebe a kpọrọ “Last Bus stop New Haven” ma mụnye ụlọọrụ Pinnacle Filling station bụ nke a sị na Gọvanọ Peter Mbah nwe ọkụ.
Mana ndi nta akuko Igbo mere nyocha ma chọpụta n’ezie na ndị ojiegbe bịara ebe ahụ n’abalị Tuzde, ha gbara nnukwu egbe, chụsasịa ndị mmadụ mana ha agbaghị Pinnacle Filling Station ahụ ọkụ.
Onye ntaakụkọ ndi nta akuko gara ebe ahụ n’ụtụtụ Wenezde 21 Juun, 2023, onyeisi ụlọọrụ a gwara ya na ọ bụ eziokwu na ndị ojiegbe wakporo ụlọorụ ha mebie ụfọdụ igwe ọrụ ha.
O kwuru na ha chọburu ịgba ya ọkụ mana ha emechaghị mee nke a. Onyeisi ụlọọrụa kwuru na ọ gala mee mkpesa n’aka ndị uweojii.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *