Take a fresh look at your lifestyle.

Ọ bụ Eziokwu na Nnamdi Kanu achụọla Ozekhome, Ejiofor dịka ndị ọkaiwu ya?

0 284

Nwanne Mazi Nnamdi Kanu bụ Kanunta Kanu, ekwuola na ezinụlọ Kanu achụọla ọkaiwu Mike Ozekhome na Ifeanyi Ejiofor dịka ndị ọkaiwu na-anọchite anya Nnamdi Kanu n’ụlọikpe.

Mana ndị ọkaiwu abụọ a, Ozekhome na Ejiofor ekwuola na nke ahụ bụ okwu ụgha, nakwa okwu nkọgheri.

Nnamdi Kanu bụonyeisi ndị otu ‘Indigenous People of Biafra’, bụ ndị na-azọ maka nnwereonwe mpaghara ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa nke ha na-akpọ mba Biafra.

Kanu nọ na mkpọrọ ndị ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa bụ DSS n’Abuja, n’agbanyeghị na ụlọikpe mkpegharị enyela iwu ka atọhapụ ya.

N’ụbọchị Tọzde nakwa taa bụ Fraịde, bụ ụbọchị 15 na 16 nke ọnwa Jun 2023, Kanunta dere n’akara Twitter ya na Ozekhome na Ejiofor ereela Nnamdi Kanu ma gbahapụ ya na mkpọrọ.

Kanunta boro ebubo na Ozekhome na Ejiofor gbochiri ndị dọkịta bịara inye Nnamdi Kanu ọgwụgwụ n’ebe ọ nọ n’ụlọmkpọrọ ndị DSS kamgbe ọnwa June afọ 2021.

“N’ihi ihe ndị a, anyị (bụ ezinụlọ Mazi Nnamdi Kanu) achụọla Moke Ozekhome (SAN) na Ifeanyi Ejiofor dịka ndị ọkaiwu na-anọchite anya Nnamdi Kanu,” ka Kanunta dere.

“Ezinụlọ Kanu na-ekele ụnụ maka mbọ niile ụnụ gbarala, biko nyefeenu akwụkwọ ikpe niile na-egbughị oge.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *