Take a fresh look at your lifestyle.

PDP akpọọla onyeisi Inec, Mahmood Yakubu, ka ọ bịa gbaa akaebe n’ụlọikpe

0 382

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị ‘Peoples Dmemocratic Party’ (PDP) ekwuola na ha enyela Mahmood Yakubu, bụ onyeisi ngalaba nhazi ntuliaka bụ Inec n’ịchafụ, akwụkwọ ka ọ bịa gbaa akaebe n’ụlọikpe dịka ikpe gbasara ntuliaka ọkwa onyeisiala nke afọ 2023 ka na-aga n’ihu.

Ọkaiwu ndị PDP bụ Chris Uche, kwuru nke a n’ụbọchị Tuzde dịka ikpe nke taa bịara n’isi njedebe n’ụlọikpe mkpegharị dị n’Abuja.

Nke a na-abịa dịka ndị PDP kpọrọ ndị akaebe ha nke iri na itolu na iri abuo n’ụlọikpe taa.

Onye akaebe nke mbụ bụ nwa amadị aha ya bụ Alex Adum Ter, onye lekọtara atụmatụ ngụkọ etu ntuliaka si gaa maka party ahụ bụ nke a kpọrọ na bekee ‘coordinator PDP national situation room’.

Nwoke a gosiri ụlọikpe onyonyo dị icheiche ebe onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu nakwa ndị isi Inec ndị ọzọ nke tinyere onyeisi mgbasaozi ha bụ Festus Okoye, na-ekwu na dịka ntuliaka na-aga n’ihu, a ga na-eziga mpụtara ntuliaka n’ọbaozi ‘Inec Result Viewing Portal’ maọbụ Irev n’ịchafụ.

Ọ gara n’ihu kwuo na n’agbanyeghị nkwa niile ndị a Inec kwere, ha emezughị ya n’ụbọchị ntuliaka.

Alex Adum Ter gosikwara ụlọikpe ahụ akwụkwọ ha wetara n’ọbozi Inec gosiri mpụtara ntuliaka si n’ọgbọ vootu dị icheiche.

O wetakwara akwụkwọ ọzọ gosiri ọgbọ vootu ọnụọgụgụ ya dị 9,403 bụ ebe Inec etinyeghị mpụtara ntuliaka.

Ndị ọkaiwu APC na ndị nke Tinubu kwuru ka ụlọikpe ghara ịnabata ihe akaebe ndị ahụ, mana ụlọikpe nabatara ha.

Ọzọkwa, ndị PDP kpọrọ onye akaebe ọzọ aha ya bụ Olatunji Shelle, bụbụ onye agha mmiri lara ezumike nka.

Ọ gwara ụlọikpe ahụ na e nwere ọgbaaghara n’ọgbọ vootu iri na ise ndị na mpaghara ya.

O kwuru na ya nwetara akụkọ maka ọgbaaghara a mana ya ejighị ụkwụ ya garuo n’ebe ndị ahụ.

Ụlọikpe yigharịrị ikpe ahụ ka ọ dị ụbọchị Wenezde, ụbọchị iri na ano nke ọnwa June 2023.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *